Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ 39 Maka Ohi, Ntọ̀ Na Arụrụala Ndị Ọzọ

Aug 20, 2021 - 15:45
 0
Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ 39 Maka Ohi, Ntọ̀ Na Arụrụala Ndị Ọzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii ala Nigeria anwụchiela mmadụ iri atọ na iteghete a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'ụdị arụrụala dị iche iche, dịka ohi, ịtọ̀ mmadụ, igbu mmadụ, ịtụ mgbere ọgwụ ike, ibugharị nwgaọgụ, igwù ojoro n'usoro ịntanetị, tinyere ọtụtụ arụrụala ndị ọzọ ha na-arụ na mpaghara ebe dị iche iche.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ CP Frank Mba mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, ma kwuo na a nwụchikọrọ ndị ahụ oge ndị uweojii ahụ bagidere n'ọrụ ịchụ nta ndị omekome na mpaghara ebe dị iche iche.

O mere ka a mara na ihe dị iche iche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyèrè égbè RPG launcher abụọ, égbè AK47 iri na atọ, nsụnsụ égbè anọ, ngwùgwù ọgwụ ike dynamite ruru iri ise na asatọ n'ọnụọgụgụ, mgbọ égbè AK47 ruru narị asaa na iri isii na iteghete, ụdị mgbọ égbè ọzọ ruru iri atọ n'ọnụọgụgụ, ọtụtụ ekwentị, sim kaadị ruru otu narị na iri ise n asaa, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

O nyere aha ụfọdụ ndị ahụ dịka Yahaya Zakari (gbara ahọ iri anọ na isii), Ntui Lambert (gbara ahọ iri atọ na isii), Shehu Aliyu (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), Umar Abubakar (gbara ahọ iri anọ na abụọ) Abubakar Mohammed (gbara ahọ iri anọ na otu), Okala Joseph (gbara ahọ iri asaa na astọ) tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ebe dị iche iche a nwụchikọrọ ndị ahụ gụnyere steeti Cross River, steeti Benue, Abuja, na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali Baba kelere ndị ọrụ ya maka ezigbo ọrụ ahụ ha rụrụ n'ịnwụchikọ ndị ahụ, ma nyekwazie ụmụafọ Nigeria olileanya na ndị uweojii agaghị ada mba n'inye ha ezi nchekwa.

Dịka ọ na-akọwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe nwgangwa e mechara nnyocha banyere ha na arụrụala ha, ọ dụkwazịrị ndị omekome na ndị ọzọ na-etinye aka n'ihe ọjọọ ka ha sepu aka n'ime nke ahụ, n'ihi na ndị ọrụ ya ga-aga n'ihu ibu agha megide mpụ na arụrụala.

Ọ gwara ọhaneze ka ha kpachapụ anya n'etu ha si ejide ekwentị ha na sim kaadị ha, ọkachasị sim kaadị ndị nke ha ji eme ihe gbasaara akara ọba ego ha, ma nyekwazie ha ndụmọdụ ka ha na-akpọtụrụ ndị ọrụ nchekwa ma na-enyekwa ha mkpesa oge ọbụla ha zutere ọnọdụ ntụmadụ, iji gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484