Ndị Amị̀ Etiela Chiwetalụ Agụ Gwòògwòò n'Onitsha maka Iyì Uwe Ndị Biafra

Oct 7, 2021 - 21:12
 0
Ndị Amị̀ Etiela Chiwetalụ Agụ Gwòògwòò n'Onitsha maka Iyì Uwe Ndị Biafra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụnnọ́ọ ụ̀wà bịa kirie taa n'Onitsha, steeti Anambra, oge ndị Amị, bụ ndị ọrụ agha Naịjirịa nwụ̀chiri otu onye a mà àmá na-eme ejije Nollywood, bụ Maazị Chiwetalu Agu, ma tie ya gwòògwòò maka iyì akwa ndị Biafra na-aga n'aga n'okporoụzọ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ka o yì ọmarịcha uwe ahụ na-agara onwe ya na mpaghara Upper Iweka dị n'Onitsha, Chinwetalụ Agụ, onye dị ahọ iri isii na ise bụkwàzị̀ onye ndị Amị ahụ wakpòrò, nwụchie ya, tụọ ya n'ala, dọkpụrụ ya, ma màlite iti ya ihe ka ụmụaka, na-emekwa ya ụdị àkàje dị icheiche.

Ndị ọnọmgbeomere kwùkwàrà na ya bụ nwa amadi na-ekesàrá ndị ụwa na-atụ n'ọnụ nri, ihe oriri na ihe enyemaka ndị ọzọ n'Onitsha ahụ tupu ya bụ ihe wee mee, bụkwazị nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọọ n'ebe ahụ wee na-ekiri ebe a na-agwọ ya bụ nwa amadi ji mmanụ n'ala, n'ihu ọha mmadụ. 

Kaosiladị, o nweghịkwa onye ọbụla n'ime ha nwere ike itinye aka maọbu zọpụta ya, maka na nkịta anaghị azọpụta diòchì n'aka añụ.

Ka ọ dị ugbua, mbọ niile a gbara iji nweta ọnụ mmirriokwu onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi na mmekọrịta ọhaneze, bụ Brigadier General Onyema Nwachukwu banyere ihe ahụ ndị ọrụ ya mere, ámịtàghị mkpụrụ ọbụla, n'ihi na ọ zaghị ekwentị ya maọbụ zaghàchi ozi e zigaara ya, wee ruo oge e jiri bipụta akụkọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484