Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ Anọ Maka Ohi, Ntọntọ Na Ịkwasò Iko n'Iké

Nov 20, 2019 - 18:39
Jan 21, 2021 - 18:40
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ Anọ Maka Ohi, Ntọntọ Na Ịkwasò Iko n'Iké

Agba nke abụọ nke atụmatụ Operation Kpochapụ, bụ nke a gbàpèrè nso-nso a site n'aka Gọvanọ Willie Obianọ na-achị steeti Anambra, ka na-aga n'ihu na-amịtawanye mkpụrụ ọma, ma na-adọtawanye ọtụtụ akụkọ ọgbụgba àmà dị iche iche.

Nke a bụ nke pụtara ìhè ọzọ na nso-nso a, dịka ndị uwe ojii steeti ahụ nwụchikọrọ mmadụ anọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi, ndị na-atọrọ mmadụ nakwa ndị na-akwasò nwaanyị iko n'ike.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ nso-nso a site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed, n'aha onyeisi ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ Maazị John Abang.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ndị òtù ọrụ ahụ pụrụ iche ná-ebu agha megide ohi, bụ 'Special Anti Robbery Squad (SARS)' nwụchikọrọ otu Maazị Collins Ọkpala gbara ahọ iri abụọ na ise; Maazị Chịmụanya Nwachukwu gbara ahọ iri abụọ, Maazị Kenechukwu Anyasị gbara ahọ iri abụọ na atọ, tinyere Maazị Pascal Ogbuagụ gbara ahọ iri abụọ na abụọ n'Ọzụbụlụ dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke steeti Anambra.

Ndị omekoome atọ a ka e kwùrù na ha dakpòro otu nwa agbọghọ gbara ahọ iri abụọ na ótù, pụnara ya ihe niile o ji, ma rie ya 'ọkọmbọ' n'ike.

Ndị ahụ ka e kwùrù na ha serekwàrà ònyòyóò ebe nwata nwaanyị ahụ gbà ọtọ oge ahụ ha na-amazụrị ya, ma gwa ya na ọ ga-akwụ ha otu nde nàrị ma, e meghị ma ya, ha agbaa ya bụ onyoonyoo n'anwụ wee mebie aha ya.
Otu ọ dị, ndị a, bụ ajọ nkịta ji isi anya ọkụ kwètàra n'eziokwu sị na ha mèrè ya bụ ihe; ma, ndị uwe ojii anapụtakwala ha onyonyoo ahụ, ebe ha bụzịkwa ndị a ga-akpụpụ ụlọ ikpe oge adịghị anya, ka e were usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

Onyeisi ndị uwe ojii, bụ Maazị John Abang kwere nkwà na ndị uwe ojii steeti ga-aga n'ihu ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, ọ kachasị n'oge mmemme ekeresimeesi a.

O tokwazịrị aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo ya nye ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ, ma kpọkuziekwa ọhaneze ka ha na-enye ndị ọrụ ncheka ozi banyere ije maọbụ onye ọbụla a na-enyo ènyò na mpaghara ha, iji nyere ha aka n'ọrụ ha, n'ihi na ha bụ ndị ọrụ nchekwa agaghị abụ ọnọ n'ụlọ mara ihe zụrụ n'ahịa maọbụ ọnọ na ndò ahụ ọnwa, nke na ha ga-amacha maọbụ hụchaa ihe niile.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.