Mmemme Ekeresimeesi: Ndị Uwe Ojii Ekwe Ndị Anambra Nkwà Ezi Nchekwa

Mmemme Ekeresimeesi: Ndị Uwe Ojii Ekwe Ndị Anambra Nkwà Ezi Nchekwa

Dec 12, 2019 - 05:46
Jan 21, 2021 - 05:47
 0
Mmemme Ekeresimeesi: Ndị Uwe Ojii Ekwe Ndị Anambra Nkwà Ezi Nchekwa

By Izunna Okafor

Isi ọchịchị ụwe ojii ala anyị ekwela ndị Anambra nkwà ezi nchekwa na gburugburu niile nke steeti ahụ tupuu, mgbe a na-eme, nakwa mgbe e mèchara mmemme ekeresimeesi a.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ osote onyeisi ndị uwee ojii n'ala Nigeria, bụ DIG Celestine Okoye n'okwu ya mgbe ọ gara kpọtụrụ aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ n'ebe obibi ya dị n'Amawbịa.

DIG Okoye, bụ nwa afọ steeti Anambra, ma bụrụkwa onye na-ahụ maka usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ, bụ ICT n'isi ụlọ ọrụ uwe ojii, kèlèrè Gọvanọ Willie Obianọ maka ọtụtụ ihe dị iche iche dara ụdà o mepụtagòrò n'ịkwàlite ọnọdụ nchekwa na ndị ọrụ nchekwa n'ime steeti ahụ.

Dịka ọ na-akọwapụta na ya kpebìrì ka o buru ụzọ bịa kpọtụrụ Gọvanọ steeti nke ya tupu ọ gabazie steeti ndị ọzọ; DIG Okoye mere ka a mara na ya na Gọvanọ Obiano enweela ezigbo mkparịta ụka banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, ma kwezie nkwà na e nwere ihe ga-esi n'ụlọ ọrụ ya wee bàta n'ime steeti ahụ n'oge adịghị anya.

Na nzaghachi, Gọvanọ Obianọ, onye nabàtàrà ya bụ nwa amadi n'ụzọ pụrụ iche, kèlèrè ya maka ịbịa kpọtụrụ ya, maka na a na-esi n'ụlọ mara mma wee pụba ama.

O kwere nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ibu agha megide ndị omekoome, mpụ na arụrụala na steeti ahụ wee ruo mgbe a nụdobere akụkọ ha na kpamkpam.

O kwuru na ọchịchị ya nwere ezi mmasị n'ihe ọbụla metụtara ọnọdụ nchekwa, bụzị nke mere o ji etinyekarị anya na ngalaba ahụ, n'ihi ọtụtụ uru dị iche nke ahụ na-eweta, ma nyekwazie òwùwè anya na ha ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ iji wee nọgidesie ike n'iwetara ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ nchekwa tọọrọ àtọ.

Ọ kpọkuzịkwara ndị Anambra bi n'ebe dị iche iche ka ha bàtaruo ụlọ nke ukwuu n'oge mmemme ekeresimesi a na-atụghị egwu maka ndị omekoome, n'ihi na o nweghị na-eme.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John Abang tòrò Gọvanọ Obianọ maka ezi ọrụ ya na nkwàdo ya n'ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

O kelekwara ya maka ibunye ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ kpọcha kpọcha akụrụngwa ọhụụ, bụ ụdị o nwebeghị steeti ọbụla na mba Africa niile tinyegoro ya n'ọrụ, ma kwe nkwa na ha ga-aga n'ihu n'ibu agha megide mpụ na arụrụ ala na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.