Ndị Uwe Ojii Anambra Anwụchiela Ndị Na-Apụnara Mmadụ Ụgbọala

Aug 8, 2019 - 18:51
Jan 21, 2021 - 18:51
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Anwụchiela Ndị Na-Apụnara Mmadụ Ụgbọala

By Izunna Okafor

Ndị uwe ojii steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ ise kpara nkàta wee jiri egbè pụnara otu nwa amadi bụ maazị Nzube Udegbu ụgbọala Toyota Camry ya n'Ọnịtsha, n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ a.

Dịka ozi isi ọchịchị ndị uwe ojii na steeti ahụ kụpụrụ nso-nso a, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ maazị Harụna Mọhammed sìrì kọwaa, ụmụokorobịa ise ahụ, bụ maazị Emmanuel Amaechi (gbara ahọ iri atọ na ise), maazị Innocent Onyedịkachi (gbara ahọ iri na iteghete), Obinna James (gbara ahọ iri abụọ), maazị Chukwuma Edeh (gbara ahọ iri abụọ na abụọ) na Tochukwu Owor (gbara ahọ iri abụọ na asaa) ka e kwùrù na ọ bụ n'Ojoto dị n'okpuru ọchịchị Idemili, ka a nwụchikọrọ ha, site n'aka ndị òtù ọrụ SARS, bụ 'Special Anti Robbery Squad'.

Ka ọ dị taa, ya bụ ozi mere ka a mara na ndị uwe ojii anapụtala ndị ahụ ụgbọala ahụ, ma kwukwazie na nnyocha ka na-aga n'ihu banyere ya bụ okwu, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe wee kọọrọ ha ihe e ji eme nwaịkpọ.

N'okwu dịkwa ka ibe ya, ozi ọzọ sikwa n'aka ndị uwe ojii ahụ na-ekwu na ha ejidekwala ndị omekoome ọzọ ji ụzọ aghụghọ ọhụụ were ezu ohi n'Awka.

Ndị amakeekwu ahụ sitere Gariki Ugwuọba, na steeti Enugu, nke gụnyere maazị Eko Charles (gbara ahọ iri abụọ na ise) na maazị Rabiu Idris gbara ahọ iri abụọ na anọ ka e kwuru na ha gara n'ebe otu nwoke, bụ maazị Godwin Chukwu na-ere ihe na mpaghara ụzọ Zik Avenue wee zụrụ ahịa pụtara narị puku Naịra abụọ (N200,000) ma gwùó ya ojoro site n'izigara ya ozi adịgboloja n'ekwentị na-egosi na ha akwụnyerela ya ego ahịa ahụ n'akara ọba ego ya, bụ nke nwa bekee kpọrọ (bank alert); o wee bunye ha ahịa.

Dịka ya bụ akụkọ siri kọọ, ndị omekoome a gakwàrà ebe ahụ ụbọchị ọzọ wee mekwa otu ihe ahụ mgbe ha zụchara ahịa mgbakọta ego ya pụtara narị puku Naịra abụọ na puku Naịra atọ (N 230,000).
Ma, mpiti kwèzịrị oge ya bụ nwoke jizịrị obi añụrị gaa ụlọ ọba ego ya ka ọ dọrọ ego ahụ, e wee gwa ya na ego dị otu ahụ abataghị n'akpa ego ya, nke mezịrị ka ara chọọ ịpụ ya; o wee si ebe ahụ tipù, gbara ga nye mkpesa n'ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, bànyere nke ahụ.

Ka ụbọchị ole na ole gachara, iko ndị ahụ jùrù oge ha bịakwara n'ọdụ ahịa ya bụ nwoke ọzọ wee zụọ ọtụtụ ahịa dịka ha si azụ na mbụ; ma mgbe ha na-achọzị ịpịkwa ekwentị ha otu ha sì apị na mbụ iji mee ka ozi adịgboloja ahụ batakwa n'ekwentị ya, ya bụ nwoke mèchatụụrụ ndị uwe ojii ma nye ha ụñàrà, nke mezịrị ka ha wụchie ma gbaa ebe ahụ okirikiri ozigbo, wee nwụkọrọ ha abụọ ozigbo tinye n'ụgbọala, larie.

Otu ọ dị, ya bụ ozi kọwara na ndị uwe ojii ahụ anapụtachaala ndị ahụ ihe niile ahụ ha zụrụ n'oge mbụ, ebe a ka na-eme nnyocha, ma na-ejikerekwa ịkpụpụ ha ụlọ ikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.