Anambra: Gọvanọ Obianọ, CP Owolabi Agaala Njem Nleta Ebe Ahụ E Mere Mwakpò

May 24, 2021 - 19:02
May 24, 2021 - 19:18
 0
Anambra: Gọvanọ Obianọ, CP Owolabi Agaala Njem Nleta Ebe Ahụ E Mere Mwakpò

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ etòóla ndị uweojii steeti ahụ maka mkwụdosiike ha nà ịlụ ọgụ dịka nwoke, bụ nke ha gosipụtara n'abalị ụbọchị ụka oge ndị ojiegbeezu amaghị ndị ha bụ wakpòrò ụlọọrụ uweojii 'B Division' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ya na isi ụlọọrụ 'Independent National Election Commission (INEC)' dịkwa n'Awka ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ọ gara n'ụlọọrụ uweojii 'B Division' ahụ ịga jiri anya ya wee hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, bụkwazị ebe ọ nọrọ wee gbaa akaebe na ndị uweojii ahụ gbàrà mbọ nke ukwuu site n'igbòchì ndị omekoome ahụ ịwakpò ya bụ ụlọọrụ uweojii, ya na site n'etu ha siri gbochie ha bụ ndị ọjọọ imebi ọtụtụ ihe n'ụlọọrụ INEC ahụ.

Ọ gbarụrụ ihu banyere etu ndị omekoome si awakpò ebe dị iche iche, na-ebibìsi ihe gọọmentị ma na-emekwa mkpamkpa n'ụdị dị iche iche na mpaghara ndịda anyanwụ ala Nigeria na n'ebe ọzọ, nke mezịrị ka ọnọdụ nchekwa ala Nigeria kawanyezie njọ dịka ọ dị taa.

Ya bụ Gọvanọ chètàkwazịịrị ndị uweojii ahụ na ọ bụ ụdị mkwụdosiike ahụ ha gosipụtara n'abalị ahụ ka a chọrọ ugbua n'ala Nigeria n'ebe ndị ọrụ nchekwa nọ, ọbụladị dịka o tòkwàrà ha ọzọ maka ezi ọrụ ha, ma kwe nkwà na gọọmentị ga-edozigharị ụfọdụ ihe ndị omekoome ahụ mebìsìrì n'ebe ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na mkpesa o nwetara n'aka onyeisi uweojii steeti ahụ na-akọwa na o nweghị onye uweojii ọbụla a gbagburu, kama na ndị uweojii ahụ gbàgbùrù ụfọdụ ndị omekoome ahụ n'abalị ahụ; ma kelezie isi ọchịchị uweojii steeti ahụ maka ezi ọrụ ndị òtù ya.

Na mbụ n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'isi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Chris Owolabi mèrè ka a mara na ọ a
gagharịala n'ebe abụọ ahụ ndị omekoome ahụ wakpòrò wee jiri anya ya hụ ka ihe siri dị n'ebe ahụ.

Dịka o siri kọwaa, mwakpò ahụ màlitèrè n'ihe dịka elekere asatọ nke anyasị ụbọchị ụka ahụ oge ndị omekoome ahụ wụchàrà n'ogige ụlọọrụ uweojii 'B Division' ahụ, wee bido ịkwà mgbọ; nke mezịrị ndị uweojii ahụ jiri wee zaghachizie ha site n'ibusò ha agha ozigbo; ha wee kwàbazie mgbọ, maka na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere anụ n'ọkọchị na n'udummiri.

O kwuru na ndị omekoome ahụ jìrì ụgbọala 'Hilux' ruru anọ n'ọnụọgụgụ wee bịa ya bụ njem, ma kwukwa na ha wakpòkwàrà ụlọọrụ INEC, bụ ebe ha nọrọ wee jiri ogbunigwè mmanụọkụ (petrol bomb) wee gbaa ótù ụlọ ebe a na-edebegasị ihe n'ụlọọrụ ahụ ọkụ, ya na ụfọdụ ụgbọala a dọbara adọba n'ebe ahụ.

Dịka o siri kwuo, o nweghị onye ọbụla n'ime ndị uweojii ya ndị omekoome ahụ gbagburu; mana ndị uweojii gbàgbùrù ụfọdụ n'ime ndị omekoome ahụ bịara ya bụ ijè, ma nwekọtasịkwa ọtụtụ ihe ndị omekoome ahụ jiri wee bịa ọrụ ahụ.

CP Owolabi kọwàrà na o nweghị ihe ọzọ ndị omekoome ahụ mètèrè n'ọrụ ahụ ha bịara n'abụghị na ha gbàrà otu akụkụ ụlọọrụ uweụojii 'B Division' ahụ ọkụ, ya na ótù akụkụ ụlọọrụ INEC na ụfọdụ ụgbọala; ọbụladị dịka o nyere owuweanya na ụlọ nke bụ isi ụlọọrụ INEC kpọmkwem kà kwụ chịmchịm, ya na ogige uweojii 'B Division' ahụ kpọmkwèm n'ihi atụmatụ na ebumnobi ndị omekoome ịgba ebe niile ahụ ọkụ màrà afọ n'ala, ha wee gbubìrizie ya bụ agwọ ọdụ.

O kwuru na ndị uweojii ahụ nwèkọtàrà ụgbọala atọ ndị omekoome ahụ jiri wee bịa ya bụ ọrụ ọjọọ, tinyee ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha nwètara n'aka ha.

O nyèkwàzịrị ọhaneze owuwèanya na égwù adịghị, maka na ha ewegharakwala ọnọdụ; ma gwazie onye ọbụla nwere ihe iwu kwàdòrò ka ọ pụta gaara onwe ya ebe ọ na-aga.

O kwukwara na ha ka na-eme nnyocha banyere mwakpò ahụ, ma kwuo na ha ga-ewepụta ozi banyere ndị omekoome ole ndị ọrụ ya gbagburu, na ozi ndị ọzọ dị mkpà banyere mwakpò ahụ.

Ihe dị iche iche ndị uweojii ahụ nwèkọtàrà n'aka ndị ahụ gụnyèrè égbè ruru asatọ n'ọnụọgụgụ, mgbọ egbe, hámà, òkpú, ụgbọala atọ, ọgwụ a gwọrọ agwọ dị n'ime ụgbọala ha, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, onyeisi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwàchukwu Orji, mere ka a mara na imeụlọ ebe ahụ ndị omekoome ahụ gbara ọkụ bụ ebe a na-edebegasị ụfọdụ ihe ha ji arụ ọrụ, tinyere ụfọdụ ụgbọala ụlọọrụ ya dị n'akụkụ ebe ahụ. O kwukwara na o nweghị onye ọrụ ya ọbụla tụfùrù ndụ ya n'ebe ahụ.

N'ụtụtụ ụbọchị Mọnde ahụ, a hụkwazịrị ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra ka ha na-agbanyụsị ọkụ ahụ na-enwu n'ụlọọrụ INEC ahụ, bụ ebe a hụkwazịrị ọtụtụ ígwè ọkụ jeneretọ ọkụ gbarikọrọ n'ebe ahụ. A hụgasịkwara ọbara ndị mmadụ gbasara n'ụfọdụ ebe n'ogige ụlọọrụ INEC ahụ na okporoụzọ dịgasị na mpaghara ebe ahị ndị ahụ mere mwakpò ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484