Ndị Omebe Iwu Anambra Anabàtala Ndị Isi Nchere Oge n'Okpuru Ọchịchị 21

Oct 10, 2019 - 01:28
Jan 22, 2021 - 05:56
 0
Ndị Omebe Iwu Anambra Anabàtala Ndị Isi Nchere Oge n'Okpuru Ọchịchị 21

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị omebe iwu steeti Anambra nọrọ n'ụbọchị Tuuzdee wee nyòchaa ma nabàta aha mmadụ iri abụọ na otu aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ zigaara ha ịbụ ndị isi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwèrè na steeti ahụ.

Ya bụ nnyòcha na nnabata ndị isi oche ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọ ọrụ omebe iwu steeti ahụ dị n'Awka, bụkwa ndị e kwùrù na ọ bụ ọnwa atọ ka ha ga-eji ọkwa ahụ, nke e nwere ike imegharị ma ọ bụ gbatịnyekwuo ya, ma ha nọzùo.

N'okwu ya banyere nke ahụ, ọka okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kwuru na nnyocha na nnabata ndị ahụ gbakwàsàrà ụkwụ n'ịkwàlite ezi ọchịchị ime-ime obodo na steeti ahụ, ma sịkwa na ndị ahụ bụ ndị e lerùru anya ma nyochaa nke ọma wee hụta ha dịka ndị tozùrù òkè iji ya bụ ọkwa.

Ọ kpọkùzịrị ndị ahụ ka ha gbado anya ma sonyekwa n'ịkwàlite ezi atụmatụ mmepe Gọvanọ Obianọ ji n'aka na steeti ahụ, ma leruokwa anya ka ọrụ si aga n'okpuru ọchịchị ha dị iche iche, ọbụnadị dịka ọ gwàra ha ka ha tụpụtasịa ọmarịcha atụmatụ mmepe dị iche iche n'okpuru ọchịchị ha ma sepukwa aka n'ihe ọbụla nwere ike ịgbaghàchi aka elekere azụ na mmepe okpuru ọchịchị ha. Ọ dụkwara ha ka ha ghara ime ihe ọbụla pụrụ ịkpụtọ ma ọ bụ tetọọ aha ha ma ọ bụ aha gọọmenti steeti ahụ.

N'okwu ya n'aha ndị òtù ya, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị Idemili North, bụ Maazị Raphael Nnabụife kèlèrè ndị omebe iwu ahụ maka ịnabàta ha iji ọkwa ahụ dị oke elu, ma kwekwazie nkwà na ha agaghị agharịpụ ọchịchị steeti Anambra na ụmụ afọ steeti ahụ, kama na ha ga-arụ ọrụ nke ọma na n'ikwesi ntụkwàsị obi.

Otu onye nọchitere anya ọgbọ nta nkwàdi Nnewi North n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ n'oge gara aga, bụ Maazị Chukwudi Orizu, na osote ọka okwu ụlọ omebe iwu ahụ n'oge mbụ, sò na ndị ahụ a nabàtara aha ha ịbụ ndị isi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ha dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.