Ndị Uwe Ojii Anambra Ejide Ma Kpọgharịa Ndị Omekoome Iri Asaa Na Otu

Oct 30, 2019 - 18:54
Jan 21, 2021 - 18:55
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejide Ma Kpọgharịa Ndị Omekoome Iri Asaa Na Otu

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra akpụgharịala ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekoome, dị iri asaa na otu n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Nke a bụ nnọọ otu n'ime akụkọ ọgbụgba ama sochigoro amụmà 'Operation Kpochapụ' nke abụọ, bụ nke aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ gbàpèrè na nso-nso a iji kwàlitekwuo agha ahụ a na-ebu megide mpụ, ohi, otu nzuzo, ntọrị mmadụ, tinyere arụrụ ala na omekoome ndị ọzọ.

N'okwu ya oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwee ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed, bụ onye mere nke ahụ onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John Abang mere ka a mara na n'ime mmadụ iri asaa na otu ahụ, mmadụ ise bụ ndị a nwụchikọrọ maka ntọrị mmadụ, ibugharị onwe ha dịka ndị ọrụ agha ala anyị, na igwù ojoro, ndị ótù onye n'ime ha bụ onye ji ótù ahọ efe àla nna anyị na steeti Delta.

Ọ sị na mmadụ iri anọ na otu bụ ndị a nwụchikọrọ maka òtù nzuzo; ebe e jidekwara mmadụ iri abụọ na abụọ maka ohi na arụrụ ala ndị ọzọ. O kwuru na a nwụchikọrọ ndị òtù nzuzo a site na njikọ aka nke òtù ọrụ nchekwa ahụ na-ebu agha megide òtù nzuzo na mahadum Unizik, bụ nke a maara dịka Unizik Anti-Cult.

Ndị ahụ e jidere maka igwù ojoro ka e kwùrù na ji otu nwa amadi bụ Oledịmma Macdowal n'ọrụ, ma kapụ ya ego dị otu nde naịra na ụma abụọ.

Ihe e nwekọtara n'aka ndị ahụ gụnyèrè nsụnsụ egbe, mmà, anyike, ọgwụ ike, anwụrụ ike, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ji eyi ụmụ mmadụ égwù.

N'akụkọ dịkwa ka ibe ya; a nọrọ ụnyaahụ wee kpụgharịa ụmụnwaanyị atọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọrị mmadụ, maka ịtọrọ ụmụaka ụmụnwoke abụọ, bụ Mustapha Abdulazeez, gbara ahọ abụọ, na Wahlid Yusuf gbara ahọ atọ, bụ ndị e kwuru na a tọọrọ n'abalị iri abụọ nke ọnwa a, na steeti Gombe, ebe ha nọ na-egwuru onwe ha egwuregwu.

Dịka nnyocha e mere siri kọwaa, otu nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Blessing Joe, sitere steeti Baụchi tọọrọ ụmụaka abụọ ahụ na steeti Gombe, wee kpọrọ ha gbadata Ọnịtsha ebe ya na ndị òtù ya bụ Oriakụ Faith Ọkpa sitere Ugep n'ime steeti Cross River (bụkwa nne nwaanyị dị ime ọnwa oruru) na Oriakụ Ngọzị Tisiobi sitere Achina n'ime steeti Anambra chọrọ ịnọ wee ree ha n'ọnụ ego dị narị puku naịra asaa na iri ise (n'otu n'otu); tupuu aka ndị uwe ojii wee nwụchikọọ ha.

N'oge mbụ, site n'ajụjụ ọnụ a gbara ya, ya bụ nwaanyị tọọrọ ụmụaka ahụ, bụ Oriakụ Blessing Joe na-ekwụbụ na otu n'ime ụmụaka ahụ bụ nwa ya mụrụ n'afọ ya, ebe nke ọzọ bụ nwa nwanne ya nwaanyị nwụrụ anwụ; mana o mezịrị ya 'taa kpuchie ọnụ' oge ndị bụ nne na nna ụmụaka ahụ n'eziokwu nwètara ozi site na Facebook na ndị uwe ojii hụrụ ụmụ ha na steeti Anambra; ha wee bịaruo, kwuo na ụmụ ha n'eziokwu, bụkwa nke pụtara ìhè n'otu ụmụaka ahụ siri wee ñụrịa ma makụdo ha ngwa-ngwa ha hụrụ ha.

Ka ọ dị taa, ndị nne na nna ahụ akpọrọla ụmụ ha laa, ebe ndị uwe ojii ka na-emekwa nnyocha bànyere ya bụ okwu na okwu ndị omekoome ndị ọzọ ha jidere.

N'ịgbaso nke, ya bụ onyeisi ndị uwe ojii fòòro ntutu, taa, sị na ha bụ ndị ọrọ nchekwa agaghị ezu ike n'imemìlà na ibuso mpụ, ohi na arụrụ ala agha na steeti ahụ, ruo mgbe a chụrụ ha niile ọsọ ụkwụ erughị ala na ya bụ steeti.

Ka ọ na-etò aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo ya nye ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ; ọ gakwazịrị n'ihu kelee ọhanaeze na Ndị Anambra maka aka ha na-enyere ndị ọrụ nchekwa, site n'ịgbara ha àmà na izunye ha ohi ozi dị iche iche na-enyere ha aka ịnwụchikọ ndị omekoome na ya bụ steeti.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.