Dayọsiisi Ekwulọbịa Emeela Emume Ncheta Ọgbụgba Otu Ahọ

Mar 12, 2021 - 12:04
 0
Dayọsiisi Ekwulọbịa Emeela Emume Ncheta Ọgbụgba Otu Ahọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ekwulọbịa nọrọ n'ọdịnso a wee merùbe emume ichètà ọgbụgba otu ahọ e jiri guzobe ya bụ dayọsiisi.

Mmemme imerùbè oke ụbọchị ahụ bụ nke 'Apostolic Nuncio' na Nigeria, bụ 'Most Rev.' Antonio Guido Filipazz nọ n'isi ya, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St Joseph's Cathedral Ekwulobia', n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra.

N'okwu ya n'ebe ahụ, ya bụ nnukwu onyeisi nchụaja tòrò dayọsiisi ahụ maka ezi ọrụ ha na ije ozi ha n'ime otu ahọ gara aga, bụ nke o kwuru na ọtụtụ ezigbo akụkọ ọgbụgba ama jupụtara n'ime ya. 

Dịka ọ na-agbà dayọsiisi ahụ na ndị nchụaja na-eje ozi n'ime ya ume, ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha jisie ike n'ọrụ ma mee karịa etu ahụ n'ime ahọ ndị ọzọ na-abịa n'ọdịnihu, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi na ibuli dayọsiisi ahụ n'ogoogo dị elu.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị Bishọọpụ ụka Katọliiki n'ala Nigeria, a maara dịka 'Catholic Bishops' Conference of Nigeria', ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Benin, bụ 'Most Rev.' Augustine Akubueze kèlere Bishọọpụ Ekwulọbịa, bụ Bishọọpụ Peter Ọkpalaeke maka etu o si edu dayọsiisi ahụ, ma dụọ ya ọdụ ka ọ gaa n'ihu idu ha n'egwu Chineke na n'ịkwụba aka ọtọ, ọbụladị dịka ọ kpọkukwara ndị dayọsiisi ahụ ka ha na-enyekwa Bishọọpụ ahụ na ndịisi ụka ezi nkwàdo, na-ekpekwara ha ekpere, iji nwee ike ije ozi ha nke ọma n'etiti ha. O kwekwara nkwà na òtù ahụ ga-aga n'ihu ịkwàdò dayọsiisi ahụ, ma gwakwa ha ka ha kpọtụrụ ya bụ òtù oge ọbụla ha nwere ihe dị mkpa chọrọ mgbataọsọ na enyemaka ha.

Na nzaghachi, Bishọọpụ Ọkpalaeke kelere Chineke maka ọrụ ọma dị icheiche Ọ na-arụ na dayọsiisi ahụ, ma kpeere Ya ka Ọ gaa n'ihu iji ya na ndị òtù ya akwara ngwaọrụ n'imezupụta ebumnobi ya na dayọsiisi ahụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano kelere ndị Ekwulọbịa maka nkwàdo ha na-enye Bishọọpụ ahụ na dayọsiisi ahụ, ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n'ime nke ahụ, ọbụladị dịka o kwere nkwà na gọọmentị na ndị ụka ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ na steeti ahụ, n'ihi ọtụtụ mkpụrụ ọma nke ahụ mịtàgòrò.

O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo Ndị Anambra ka ha debànye aha n'ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa korona, iji wee so na ndị ga-enwete ya bụ ọgwụ, maka na a na-atụ anya na tupu ahọ abụọ malite ugbua, na onye ọbụla n'ala Nigeria agbachaala ọgwụ ahụ.

Ndị ọzọ dị icheiche sonyere na mmemme ahụ gụnyere onye ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ọba ego ala Nigeria n'oge mbụ, bụ Ọkamụụta Chukwuma Soludo; onyeisi ndị ọrụ Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị; eze ọdịnala ndị Ekwulọbịa, bụ Igwe Emmanuel Onyeneke, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche, na ndị Bishọọpụ ruru iri abụọ na isii n'ọnụọgụgụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484