N'Anambra, Ụgbọala Bu Mmanụ Agbaala Ọkụ, Gbuo Mmadụ Abụọ

May 29, 2022 - 13:05
 0
N'Anambra, Ụgbọala Bu Mmanụ Agbaala Ọkụ, Gbuo Mmadụ Abụọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nnukwu ihe ọdachi dị égwù dapụtara na nsonso a, dịka otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ na ụgbọala ọzọ sukọrọ isi ọnụ, wee binwuru ọkụ na steeti Anambra.

Ya bụ ihe ọdachi bụ nke dapụtara na nso ọdụ mmanụ ụgbọala ‘Cords Filling Station’ dị n'Ụmụnya, na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụ bụrụkwa nke mere n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee.

Dịka akụkọ siri kọọ, onye na-anyà nnukwu ụgbọala Mack ahụ e ji ebu mmanụ ụgbọala nọ n'oke ọsọ, nke na ụgbọala ahụ pụnahịrị ya n'aka, wee jirikwazie ọsọ ahụ gbakwuru obere ụgbọala shọtụụl bọọsụ ọzọ na-abịa n'ihu, ha abụọ wee sukọọ isi ọnụ ozigbo ma binwuru ọkụ.

N'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps, FRSC, (ngalaba steeti Anambra), bụ RC Margaret B. Onabe mèrè ka a mara na mmdụ abụọ nwụrụ n'ajọ ọdachi ahụ, ma kọwaa na ọkụ ahọ gbara otu onye gwoogwoo, nkè na a pụghịzịkwa ịchọpụta onye ọ bụ.

O kwukwara na ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti ahụ nyere aka wee gbanyụọ ya bụ ọkụ ọgbụgba, ebe e bunyezịkwara ndị uweojii sitere mpaghara Oyi ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ. Ọ sịkwazị na ụlọọrụ FRSC sitere mpaghara RS5.33, Nteje bịakwazịrị n'ebe ahụ ya bụ ihe mberede mere ozigbo, wee nye aka ma rụkwa ọrụ n'ụzọ pụrụ iche, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'okporo ụzọ ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyá ụgbọala aka na ntị ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, ma na-erubere iwu na-achị okporo ụzọ isi, iji gbanahị ihe mberede okporo ụzọ.

O kasìkwàzịrị ezinụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ obi, ma kpekwa ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndokwa, kpekwa ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484