N'Anambra, Nnukwu Ụgbọala Abụọ Adaala, Gbaa Ọkụ

Mar 30, 2022 - 22:34
 0
N'Anambra, Nnukwu Ụgbọala Abụọ Adaala, Gbaa Ọkụ

 


Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ndị na-anya ụgbọala ka ha na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma ma na-ebèlata etu ha si agba ọsọ, n'ihi na ịgba oke ọsọ sò n'ihe kacha ewèta ihe mberede okporoụzọ.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kpọrọ oku a n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere ajọ ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara nsonso a na mpaghara Agụ Awka dị n'isi obodo steeti ahụ, bụkwa nke ụgbọala gwongworo abụọ sitere na ya wee gbaa ọkụ. 

Ọ kọwara na ịgba oke ọsọ na elerughị ụgbọala anya nke ọma tupu e buru ya pụta n'okporoụzọ sò n'ihe na-ewètekarị ụdịrị ihe ọdachi dị etu ahụ. O mere ka a mara na ụgbọala na-adàkarị na mpaghara njikọ ụzọ Agụ Awka ahụ, bụ nke dị n'okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnisha, ma kwuo na ọtụtụ ụgbọala ndị ahụ bụ ụgbọala e lerughị anya nke ọma maọbụ nke e kwesighị ibu pụta n'okporoụzọ.

Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na ụzọ ahụ adịchaghị mma etu o siri kwesi, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere o jiri dị mkpa na onye ọbụla na-anyà ụgbọala ga-eji nwayọ ka o wee hụ ka ọnọdụ okporoụzọ dị n'ihu. O kwuru na ihe mere ọtụtụ ụgbọala, ọkachasị ndị nnukwu ụgbọala, ji adàkarị n'ebe ahụ bụ n'ihi etu ndị na-anyà ụgbọala ahụ si anya ya, etu ha si agba oke ọsọ, nakwa etu ha esighị elekọta maọbụ eleru ụgbọala ha anya nke ọma.

Ọ gbarụrụ ihu na n'agbànyèghị mbọ niile ụlọọrụ ya na-agba ịkụziri ndị na-anyà ụgbọala ihe ha kwesiri ịma banyere ịnya ụgbọala na etu e si elekọta ụgbọala anya nke ọma tupu buru ya pụta n'okporoụzọ, na ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala ka na-eme etu o siri masị ha

Ọ katọ̀kwàra etu ọtụtụ ndị na-anyà ụgbọala si etinye naanị otu akara efere n'ihu ụgbọala ha, n'etinyeghị nke ọbụla n'azụ, ma kwuo na nke ahụ na-eme ka a na-ahụta ụgbọala dị etu ahụ dịka ụgbọala e ji arụ arụrụala, tinyekwuoro na o megidere iwu na-achị okporoụzọ.

Ọ dụkwazịrị ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepu aka na ya ma tinye akwụkwọ maka inwete akara efere ọzọ ma ọ bụrụ na nke ochie ha furu efu, maọbụkwanụ ha adị njikere ịgba egwu a ga-akụrụ ha.

Maazị Irelewuyi gwakwàzịrị ndị na-anya ụgbọala ka ha zeere ihe ọbụla ga-ebute ọdịda ụgbọala, ụgbọala ịgba ọkụ maọbụ ụdị ihe mberede okporoụzọ ndị ọzọ na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484