A Dụọla Ndị Ntorobịa Ka Ha Sepụ Aka n'Ọgwụ Ike

Sep 19, 2021 - 22:55
 0
A Dụọla Ndị Ntorobịa Ka Ha Sepụ Aka n'Ọgwụ Ike

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola ma dụọ ndị ntorobịa ka ha sepụ aka n'ihe ọbụla gbasaara ịñụ, ịkpọ, maọbụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, n'ihi ọtụtụ ọghọm na ihe égwù dị icheiche dị na ya.

Kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Theresa Obiekezie bụ ya nyere ndụmọdụ a na mmemme otu ụbọchị ụlọọrụ ahụ chịkọbàrà maka inye ndị ntorobịa nkụzi na ndụmọdụ ma kọwakwara ihe ha kwesiri ịma banyere ọgwụ ike.

Ya bụ mmemme nkụzi bụ nke weere ọnọdụ n'obodo Otuocha, bụ isi obodo okpuru ọchịchị 'Anambra East', ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye ndị ntorobịa ahụ nkụzi site n'aka ndị dị icheiche ọnụ na-eru n'okwu.

N'okwu mmàlite ya n'ebe ahụ, Kọmishọna Obiekezie kọwààrà ndị ntorobịa ahụ ihe ọghọm na ihe egwubdị icheiche dị n'ọgwụ ike, ọkachasị dịka o siri metụta ụbụrụ, ahụike na ọdịnihu mmadụ, akụnụba, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, gburugburu na obodo n'izugbe; ma kpọkuo ndị ntorobịa ka ha sepụ aka n'ọgwụ ike, iji zèèré imemìlà ndụ ha.

Ọ katọrọ ma gbarụọ ihu bànyere etu ndị mmadụ, ọkachasị ndị ntorobịa si akpọ/añụ ọgwụ ike ahụ a na-akpọ mkpụrụmmiri taa, bụkwazị nke tinyegoro ọtụtụ n'ime ha n'ajọ ọnọdụ dị icheiche, na-akpasàsị ha anya ma mekwa ka ha na-ebibìsi ngwongwo na akụnụba ndị mmadụ, na-etinyekwa anya n'imë mpụ na arụrụala.

O kwukwazịrị na ọ bụ n'ihi ihe ndị ahụ ka ha jiri chịkọba ya bụ mmemme inye nkụzi megide ọgwụ ike, n'ihi na ọ bụ ebumnobi Gọvanọ Willie Obianọ ịkpọpụ uche ndị ntorobịa steeti ahụ pụọ n'ihe ọbụla na-ewete ala adịghị mma, ya na inye ha nkwàdo kwesiri ekwesi, bụkwazị nke ọ na-eme kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484