Ndị Ọmambala Echiela Obianọ "Odogwu Ọmambala

Oct 7, 2017 - 08:30
Jan 23, 2021 - 23:03
 0
Ndị Ọmambala Echiela Obianọ "Odogwu Ọmambala

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ anatala echichi dịka "Odogwu Ọmambala". Gọvanọ natara echichi ahụ pụrụ iche site n'aka ndị eze ọdịnala Ọmambala na mmemme ngagharị udo nke weere ọnọdụ n'ama egwuruegwu Otuọcha. Ngagharị udo ahụ, nke dọtara mkpokọta obodo iri anọ na iteghete dị na mpaghara Ọmambala, malitere site n'ịgbachapụrụ gọvanọ Obianọ ọnụ egbe iri abụọ na otu dara ụda ngwa ngwa ọ wụchara n'ebe ahụ, tupuu ọ malitezie igagharị ikele ndị mmadụ.

Ka ọ na-anabata ndị mmadụ ndị bịara mmemme ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị eze ọdịnala na steeti Anambra ma bụrụkwa eze ọdịnala Ọnịsha bụ Igwe Nnaemeka Achebe kwuputara na mmemme ahụ dabara adaba na nkwekọrịta ndị otu ahụ kwekọrịtara n'ibugharị ọkwa aka na-achị steeti ahụ na mpaghara na mpaghara nke ọgbọ nta nkwado sineeti atọ e nwere na steeti ahụ, ma sịkwazie na mpụta nke gọvanọ Willie Obianọ bụ ihe nkwalite n'ozuzu oke nyegara mmejupụta nke nkwekọrịta ahụ.

Onyeisi oche nke otu jikọtara ndị Ọmambala ma bụrụkwa eze ọdịnala Nteje bụ Igwe Rowland Odegbo mere ka a mara na ọ bụ ihe nwute na na-agbanyeghị ọtụtụ ọrụ ọma dị iche iche gọvanọ Obianọ rụgoro na steeti ahụ na ịgba dị iche iche o tigoro, na ụfọdụ ndị mmadụ sitere mpaghara ọgbọ nta nkwado "Anambra Nọọọtụ" na-apụtakwa iso zọ ọkwa aka ga-achị steeti ahụ. O mekwazịrị ka a mara na ndị eze ọdịnala niile nke mpaghara Ọmambala ji echichi ahụ wee na-egosipụta ma na-ekwuwapụta hoohaa, nkwado ha n'ozuzu oke nyegara ọchịchị Willie Obianọ nke ugboro abụọ.

Na nzaghachi ka ọ natachara echichi ahụ, gọvanọ Obianọ kelere ndị eze ọdịnala ahụ na ndị niile bụ ndị mpaghara Ọmambala maka nkwanye ugwu ahụ pụrụ iche na nkwado ha nye ịzọ ọchịchị ya nke ugboro abụọ, ma kwekwazie ha nkwa na ihe ọchịchị ya kwakọbara maka ha bụ ihe ọnụ apụghị ịkọcha.

Gọvanọ Obianọ onye mere ka a mara na otu patì APGA bụ nke o ji apụta maka ịzọ ọkwa ahụ bụ otu patì e ji eziokwu na ịgbaso ụkpụrụ ọchịchị onye kwuo uche ya wee mara, gosipụtara ezi olile anya ya na otu patì ahụ ga-eturu ugo n'ụzọ dara ụda na nhọpụta ahụ ga-ewere ọnọdụ n'ọnwa na-abịa abịa.

Ọ dụrụ ndị ahụ ka ha gaa malite ịchụ nta nkwado n'ụlọ n'ụlọ iji gbasaa ozi ọma otu pati APGA, ma mekwa ka ha mara mkpa ọ dị na otu pati ahụ tuuru ugo na ya bụ nhọpụta na-abịa abịa iji wee weta ihe gbasara nna mmirichukwu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'isi njedebe na steeti ahụ.

N'ozi ekele ya, eze ọdịnala Ụmụeri bụ Igwe Ben Emeka kpere ka echichi ahụ bụrụ nnukwu ihe agbamume wee nye gọvanọ Obianọ iji gaa n'ihu n'ezi ọrụ o ji na steeti ahụ, ebe ọ sitegoro na nke ahụ mara na o nwere ndị kwụ ya n'azụ.

Iji uwe echichi ahụ wee chọọ gọvanọ Obianọ mma, tinyere egwu ọdịnala dị iche iche a gbara so n'ihe pụrakarịchara ihe na mmemme ahụ.

Gọvanọ mechaziere wee si n'ebe ahụ gaba n'obi eze ọdịnala obodo ya bụ Agụleri, ebe ọ nọ wee zute ndị ichie, ndị echịchị, ndị ojianị na ọtụtụ ndị nkwado ndị ọzọ, ebe a nọzịkwara wee kpeere ya ekpre pụrụ iche iji hụ na nhọpụta ya nke abụọ gara siriri werere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.