Otu NIPIAN, DEVITEM na Ọba Akwụkwọ Anambra Achịkọbarala Ụmụakwụkwọ Asọmpi

Aug 1, 2021 - 21:40
 0
Otu NIPIAN, DEVITEM na Ọba Akwụkwọ Anambra Achịkọbarala Ụmụakwụkwọ Asọmpi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù nnọrọonwe a maara dịka 'Nigerian Information Professional Innovative Ambassadors Network' (NIPIAN), site na njikọaka ya na òtù 'Developmental Initiative for Technology and Empowerment (DEVITEM), na ọba akwụkwọ steeti Anambra nọrọ n'ọdịnso a wee chịkọba asọmpi Sụpèéré M (Spelling Bee) na asọmp ịgụ akwụkwọ, maka ụmụakwụkwọ praịma n'obodo Ihembosị, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo nke steeti Anambra.

Mmemme asọmpi ahụ, nke a kpọrọ 'NIPIAN Project', bụ nke dọtara ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi sitere ụlọakwụkwọ praịma dị iche iche dị n'obodo ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye ọtụtụ onyinye na ihe nrite dị iche iche nyegara ndị meriri n'asọmpi ahụ.

N'okwu ya banyere asọmpi ahụ, onye nnọchianya òtù NIPIAN ma bụrụkwa onye nhazi ihe omume ahụ, bụ Oriakụ Ngozi Perpetual Osuchukwu mere ka a mara na ọ bụ òtù 'Goethe-Institute Nigeria' na 'US Embassy' na-akwàdó atụmatụ ahụ, site na njikọaka ya na Mahadum nke Abuja. O kwuru na ebumnobi asọmpi ahụ bụ iji gbàá ụmụakwụkwọ ume ịgụ akwụkwọ na ije n'ọba akwụkwọ obodo eme ihe oge niile; ma kọwakwa na e nyere ha bụ ndị nnọchianya NIPIAN ntụziaka ịhọrọ otu obodo na ịchịkọba ihe omume ọbụla ga-enye aka ịkwalite agụmakwụkwọ n'ebe ahụ ma bàkwara obodo ahụ uru n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

Oriakụ Osuchukwu, onye bụkwa onye ọrụ ọba akwụkwọ na onye nkuzi mahadum kwuru sị, "Anyị na-abịa ebe a ụbọchị Satọde ọbụla iji mee mmemme na ihe mmụta maka ụmụaka bi n'ime obodo a; nke a bụ otu n'ime ọrụ ọbá akwụkwọ ọhaneze. Ya mere, anyị na-abịa ebe a ụbọchị Satọde ọbụla iji gụọ akwụkwọ, mụta ihe ọhụrụ, kwee ukwe, ma gbakwa egwu, n'ihi na ọbá akwụkwọ abụghị naanị maka ịgụ akwụkwọ."

Dịka ọ na-eme ka a mara na mmemme Satọde ahụ ka ga na-agakwa n'ihu, ọbụlagodi ma ugbua e mechagoro asọmpi ahụ, o kelekwara ndị dị iche iche ha na ha jikọtara aka ọnụ wee hazie ihe mmemme ahụ, ya na ndị ọzọ nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji mee ka emume ahụ gaa nke ọma; ọbụladị dịka ọ gbara ụmụakwụkwọ ahụ ume ma nye ha ndụmọdụ ka ha na-agụsi akwụkwọ ha ike oge niile. Ọ kọwakwara na e nwere ndị ọba akwụkwọ iri abụọ na ise ọzọ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, bụ ndị a họpụtara maka isonye n'atụmatụ NIPIAN ahụ, ma nyekwa ha ọzụzụ n'ụdị dị iche iche.

N’akụkụ nke ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya ma bụrụkwa nke kwesiri ka a kwàdó ma ñomie ya, n’ihi nnukwu úrù nke ahụ ga-abara ụmụaka ahụ, ọba akwụkwọ ahụ, obodo ahụ na ọhà mmadụ n'izugbe.

Dọkịta Udeze, mgbe ọ na-àgbà ụmụakwụkwọ ahụ ume ka ha na-aga n'ọba akwụkwọ oge niile ma gụọ ọtụtụ akwụkwọ ugbua ha nọ n'oge ezumike, ọ dụkwàrà ha ọdụ ka ha gbaa mbọ na-amụta okwu ọhụrụ mgbe niile, site n'idetù ya na ịchọpụta nkọwa ya na etu e si akpọ ya, mgbe ọbụla ha hụrụ ya.

N’ajụjụọnụ a gbara ya, onye ọkàikpe nke asọmpi ahụ, bụ Oriakụ Amaka Rose Alor, onye bụkwa onye ọrụ ọba akwụkwọ, mere ka a mara na ụmụakwụkwọ ahụ mere nke ọma, ma kwuo na ịkpọghàrị̀ 'r' na 'l' ọtụtụ mgbe n’okwu maọbụ n’ahịrịokwu bụụrụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ ahụ nnukwu nsogbu, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ndị nkuzi na ndị nne na nna ọdụ ka ha na-enye aka oge niile ma na-enye ụmụaka ha oge zuru òkè iji gụọ akwụkwọ maọbụ mụta ihe ọhụrụ.

N'okwu nke ya n'aha ndị ọzọ sonyere n'asọmpi ahụ, onye tuuru ùgò dịka ọkaibe n'asọmpi ahụ ma bụrụkwa nwata akwụkwọ ụlọakwụkwọ 'New Life Nursery na Primary School, Ihembosi', bụ obere Maazị Godwin Chikamso (gbara ahọ iri na otu) kwùrù na obi dị ya ụtọ nke ukwuu maka mmeri ahụ o nwetere, ọbụladi dịka o kèlèrè ndị chịkọbara mmemme ahụ maka ịhazi ya, kelee ndị mụrụ ya na ndị nkuzi ya maka nkwàdó ha na-enye ya, ma kwezie nkwà na ọ ga-aga n'ihu na-agụsi akwụkwọ ya ike, ọlachasị n'ime oge a ha nọ n'oge ezumike ga-ewe ogologo oge.

Na ntụnye nke ya, onye nkuzi nke nwata akwụkwọ ahụ tuuru ùgò, bụ Oriakụ Juliet Ejezie mèrè ka a mara na nwata nwoke ahụ nwetakwara ohere agụmakwụkwọ n'efu na nsonso a, site n'aka Maazị Ugochukwu Ubah ụbọchị ha mechiri akwụkwọ, bụ ebe ọ nọrọ wee zaa ajụjụ iri atọ otu ugboro ma zatachakwa ha niile na-adàghị nke ọbụla n'ime ha.

Ka ọ na-ekwe nkwà na ụlọakwụkwọ ha ga-aga n'ihu na-esonye na mmemme ndị ọzọ ndị òtù ahụ na ọba akwụkwọ Anambra na-achịkọba n'ọdịnihu, onye nkụzi ahụ kelekwara ndị chịkọbàrà asọmpi ahụ maka ihe onyinye dị iche iche ha nyere ụlọakwụkwọ ha, ụmụakwụkwọ ha na ndị ọzọ niile sonyere na mmemme ahụ.

Mmemme ahụ, nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ steeti ahụ dị n'Ihembọsị, bụ 'Branch Library, Ihembosi' ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee mee asọmpi sụpeere m na asọmpi ịgụ akwụkwọ maka ụmụakwụkwọ nọ n'ogo klaasị dị elu n'ụlọakwụkwọ praịma. A nọkwara na ya bụ mmemme wee kesàárá ụmụakwụkwọ na ụlọakwụkwọ niile sonyere na mmemme ahụ akwụkwọ ọgụgụ, akwụkwọ e ji ede ihe, mkpịsị odee, na akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Advanced Learners Dictionary' (mbipụta nke iri), tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484