Ndị Uweojii Ejidela Ndị Nta Maka Ịgba Ndị Gara Akwamozu Égbè

Jun 29, 2021 - 15:10
 0
Ndị Uweojii Ejidela Ndị Nta Maka Ịgba Ndị Gara Akwamozu Égbè

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii na steeti Edo ejidela ma kpọchie ndị nta abụọ maka ịgba ndị jere akwamozu égbè, ma jirikwa égbè merụsịa ha ahụ kà a ga-asị na ha bụ anụ oriri.

Ihe ọdachi a bụ nke dapụtàrà n'obodo Ama dị na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo 'Esan South-East' nke steeti Edo, ma bụrụkwa nke ndị nta ahụ sitere na ya wee merụọ mmadụ isii àhụ n'ime ndị ahụ gara akwamozu

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii steeti ahụ, bụ SP Kontongs Bello siri kọwaa, onyeisi ndị uweojii na mpaghara ụlọọrụ uweojii 'Agbede Division' bụ CSP Iredia Ogiata nwètèrè ozi banyere égbè a na-agba n'obodo ahụ.

O kwuru na oge ha nwetechara ozi ahụ, na ya bụ onyeisi ndị uweojii jikọtara ndị ọrụ ya, ha wee gaba n'ebe ahụ ya bụ ihe na-eme. Ka ha ruzịrị n'ebe ahụ, ha hụtazịrị na ndị nta ahụ jiri egbe nwere ọnụ abụọ wee gbaa ma merụọ mmadụ isii ahụ n'ebe a na-akwa ozu n'obodo ahụ, bụ mmemme akwamozu otu onye, bụ Martina Rabi lagoro mmụọ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ndị nta ahụ sòrò ndị bu ozu onye ahụ a kwara ụbọchị ahụ wee si n'Ubiaja dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Esan South-East' wee bàtaruo Ama, bụ ebe ahụ a na-akwa ya bụ ozu.

O kwuru na oge e ruzịrị n'obodo ahụ, na ndị nta ahụ malitere ịgbali egbe elu, bụ nke ha sikwara na ya wee gbabie eriri ọkụ latiriiki n'ebe ahụ.

Ọ sị na oge ndị ahụ gbabiri ya bụ eriri ọkụ, na ndị ntorobịa obodo ahụ jidezịrị onye nke ahụ gbabiri ya bụ eriri ọkọ kpọmkwem; ha wee malite ịba mba na inwe nsogbu. O kwuru na ọ bụkwazị oge ya bụ nsogbu malitezịrị ịgawanye n'ihu ka nwoke ahụ bụ onye nta jiri iwe wee gbaa ndị ahụ égbè, bụzị nke merụrụ mmadụ isii ndị bịara akwamozu ahụ ahụ n'ụdị dị iche iche.

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gàkwàzịrị n'ihu kwuo na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Phillip Ogbadu mere ka o doo anya na o nweghị onye ọbụla nwere ikike iyijà maọbụ itinye ndụ mmadụ ibe ya n'ihe égwù. 

Ọ dụzịkwara ndị obodo ahụ ọdụ ka ha wetuo obi ma ghara iji iwe mebie ihe; ọbụladị dịka o mekwazịrị ka a mara na nnyocha ka na-aga n'ihu banyere ya bụ okwu, nke mgbe e mechara ya, e nye ndị ahụ ọnọdụ ruru ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484