NDLEA Ejidela Onye Ọrụ Agha Adịgboloja Na-Ebunye Ndị Omekoome Ọgwụike, Ngwaọgụ

Oct 7, 2021 - 16:07
 0
NDLEA Ejidela Onye Ọrụ Agha Adịgboloja Na-Ebunye Ndị Omekoome Ọgwụike, Ngwaọgụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ aka kpàrá ezekudele, ọ kọọ mmụọ chibere ya ọzọ.

Ka ọ dị taa, ndị ụlọọrụ ahụ na-ebu agha megide ịñụ, ịkpọ, maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) anwụchiela otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ onye ọrụ agha adịgboloja na-ebu ọgwụike, ngwaọgụ na ihe ndị ọzọ na-èbugara ndị omekoome n'ime ọhịa naebe ndị ọzọ ha na-ezo were akpa ike, na steeti Kaduna.

Ya bụ nwoke, bụ Maazị Hayatu Galadima, na onye òtù ya bụ Hamisu Adamu ka e kwuru na e jidere na mpaghara okporoụzọ awara-awara Gwagwalada dị n'Abụja, ma bụrụkwa ndị gbakọrọ mgbọ egbe 21 RLA 7.45mm n'ime karama mmiri wee buru ya na-agakwu ndị omekoome ahụ n'ebe nzuzo ha. Ihe dị icheiche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyere àkpà igwe okwu 'walkie-talkie', ákwà mkpuchi ihu anọ na-acha ka nke ọrụ agha ala Nigeria, wọleetị (wallet) ATM ụlọ ọba ego dị icheiche juru n'ime ya, ọgwụike cannabis sativa e kechisiri n'àkpà, mkpụrụọgwụ tramadol.

E nwetekwara ihe e ji etinye simkaadị MTN atọ, 9Mobile abụọ, otu Airtel n'aka ndị ahụ, ya na otu ekwentị iPhone 12 pro, otu ekwentị Samsung A31, otu ekwentị Nokia, àkpàaka ise ihe dịgasị n'ime ha, ya na itè (gallon) mmanụ nri dị n'ime ya.

Maazị Hayatu Galadima ka e kwuru na ọ na-akọwa na ya bụ onye ọrụ agha Nigeria nọ n'ọkwa 'Lance Corporal' na-arụ ọrụ n'Ibadan, ma kọwakwa na ha na-ebuga ihe ahụ e nwetere n'aka ha na Kaduna na Kano. 

Kaosiladị, nnyocha e mere na-egosi na ọ dị ka ndị ahụ nwere ihe jikọrọ ndị ahụ na ndị omekoome na-akpa ike na mpaghara mgbagougwu ala Nigeria. Nnyocha e mere na-egosikwa na ndị ahụ na-ebugara ndị omekoome ahụ ngwaọgụ ahụ, ya na redio ahụ, iji mee ka ha na-enwete ozi, ebe ọ bụ na gọọmenti emechiela ịrụ ọrụ nke usoro nzikọrịtaozi (telecommunications services) na steeti Zamfara, Sokoto na Kaduna n'iji mkpamkpa ndị òtù agha isi ekwe ọnwụ na ndị omekoome.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Brigadier General Mohamed Buba Marwa (lagoro ezumike nka) enyela ngalaba ụlọọrụ ahụ jidere ndị ahụ, bụ ngalaba mpaghara FCT ntụziaka ka ha nyefee okwu ahụ n'aka ngalaba ọrụ agha ala Nigeria, maka ime nnyocha miri èmì banyere ihe ahụ ha mere.

Ndị ọrụ NDLEA ahụ jidekwara ọtụtụ ndị ọzọ na mpaghara ebe dị icheiche make ihe metụtara ọgwụike, nke gụnyere nwata akwụkwọ mahadum e jidere na Port Harcourt nke steeti Rivers; ndị e jidere na steeti Lagos, maka izo ọgwụike n'ime asambodo mahadum Uyo; ndị e jidere na Kaduna; tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a nwụchiri na mpaghara ebe dị icheiche.

N'okwu ya banyere ihe ndị a ndị ọrụ ya mere na agbambọ ha, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohamed Buba Marwa kwupụtara obi ụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484