Nchekwa: TRADOC Ènyela Ndị Ọrụ Agha Ala Nigeria Nkụzị n'Ịlụ Ọgụ

Feb 5, 2022 - 22:20
Feb 4, 2022 - 20:38
 0
Nchekwa: TRADOC Ènyela Ndị Ọrụ Agha Ala Nigeria Nkụzị n'Ịlụ Ọgụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma ịmụ àmụ tupu a pụta n'ọgbọ.

N'ịgbaso nke a, ngalaba na-ahụ maka nkụzi, nke ụlọọrụ agha ala Nigeria, bụ 'Training and Doctrine Command (TRADOC)’ enyela ụfọdụ ndị ọrụ agha ahụ ọzụzụ na nkụzi banyere ịlụ ọgụ, ma kọwakwara ha ihe dị icheiche ha kwesiri ịmụta nà ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka n'ịrụ ọrụ ha nke ọma, dịka otu n'ime ụzọ isi wèta ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dị n'ala Nigeria ugbua n'isi njedobe.

Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ebe a na-enye ndị ọrụ agha ọzụzụ, bụ ‘Nigerian Army Table Hill, Kachia’ dị na steeti Kaduna, ma bụrụkwa ọzụzụ nke a maara dịka ‘Battle Inoculation and Firepower Demonstration’ bụ ótù n'ime ọzụzụ mmegharịahụ a maara dịka ‘Exercise Camp Highland’. Ọ bụkwa àgbà nke ikpeazụ nke ọzụzụ ime ọhịa e nyere ndị ahụ n'okpuru atụmatụ ‘Short Service Course’.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi TRADOC, bụ ‘Major General’ SO Olabanji kwupụtara afọojuju ya banyere etu ndị ahụ e nyere ọzụzụ ahụ siri mee nke ọma, nke na-egosi na ha mụtara ihe a kụziiri ha nke ọma, ọbụladị dịka ọ kọwara na ebumnobi nke ahụ bụ iji wulite mmụọ ndị ahụ, gosi ma kụzikwara ha ihe dị icheiche ha nwèrè ike izùtè n'ihu ọrụ, ihe ha kwesiri ime nàkwà etu ha ga-esi mee ya ma ọ bụrụ na ha zute ụdị ọnọdụ dị etu ahụ n'ihu ọrụ.

Ọ dụrụ ndị ahụ sonyere n'ọzụzụ ahụ ọdụ ka ha bụrụ ndị ga na-enwe mmesàpụ ahụ na mmegharị ahụ (exercise) oge niile, gbasie ike ma nwekwa ike amamihe nà ike ọkpụkpụaka ga-enyere ha aka iji rụọ nnukwu ahụ ọrụ chere ha n'ihu, nwee ike chekwaa ala nna ha, memilaa ma búkwá agha megide ajọ ọnọdụ nchekwa na ihe ndị ọzọ metụtara na-echere Nigeria aka mgba, ọbụladị mgbe ọzụzụ ha bịara na njedobe, ha ewee màlite ọrụ n'uju dịka ndị ọrụ agha ala Nigeria.

Ọ gakwara n'ihu chètara ha na mmegharịahụ (exercise) dị̀ óké mkpa n'ọrụ ahụ, ma dụkwa ha ka ha bụrụ ndị na-adị uchu n'ọrụ ha ma na-arụkwa ya n'ikwesi ntụkwasịobi, ma ọ bụrụ na ha banye n'ọrụ n'uju.

Ihe dị icheiche a kụziiri ndị ahụ gụnyèrè ụdị mmegharị ahụ dị icheiche, etu e si akwà mgbọ ma a nọrọ n'ihu ọrụ, etu e si ezè mgbọ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka n'ọrụ dịka ndị agha.
 
Ya bụ mmemme dọ̀tàkwàrà ụfọdụ ndị selitere isi na ngalaba ọrụ agha ala Nigeria na ngalaba ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484