Ashbishọp Ibezim Adụọla Ndị Nna Ka Ha Bụrụ Ndị Agba Ekpere

Feb 4, 2022 - 20:34
 0
Ashbishọp Ibezim Adụọla Ndị Nna Ka Ha Bụrụ Ndị Agba Ekpere


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ashbishọp nke mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọp ụka Anglịkan na Dayọsis Awka, bụ 'Ashbishọp' Alexander Chibuzor Ibezim akpọkuola ma dụọ ndị nna ọdụ ka ha bụrụ ndị na-ekpesi ekpere ike, n'ihi na nke ahụ sò n'otu n'ihe a na-atụ anya n'aka ha dịka ezigbo ndị nna.

Ashbishọp Ibezim nyere ndụmọdụ a n'okwu ya na mmemme ichenwò ndị nna dayọsis ahụ n'ihu Chineke, bụ nke òfùfènrò ya wèèrè ọnọdụ n'ụlọụka ‘St. Peters’ Anglican Church, Amawbia’ dị n'okpuruọchịchị ‘Awka South’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke isiokwu ya bụ “Ndị Nna Na-atụ Egwu Chineke Bụ Ndị Agha Ekpere” (mà a tụgharịa ya na bekee).

N'okwuchukwu ya n'ofùfènrò ahụ, nke gbadoro ụkwụ n'isiokwu mmemme ahụ, Ashbishọp Ibezim kọwàrà mkpà ọ dị na onye ọbụla bụ onye nna ga-abụ onye dị ike n'ekpere, jiri ekpere tọọ ntọala ezinụlọ ya, ma na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dịịrị ya n'ezinụlọ dịka a tụrụ anya n'aka ya.

Ya bụ nnukwu onyeisi ụka Angịlịkan, Ashbishọp Ibezim nọkwàzị̀rị̀ n'oge ahụ wee nye ndi ndu ụka dị icheiche ndụmọdụ ka ha na-etinyekarị uchu n'ịkwàlite ọdịmma nke ime mmụọ na ọnọdụ obibindụ ndị mmadụ ha na-elekọta, karịa ịbụ naanị ndị na-etinye anya n'ego na ihe akụ-akụ nke ụwa. Ọ dụkwazịrị ndị nne na nna ka ha nyekwa aka n'ịkwàlite asụsụ Igbo site n'ịsụrụ ya ụmụ ha oge niile, iji ichekwaba ya bụ asụsụ ka ọ ghara ịnwụ maọbụ fùó.

Na ntụnye nke ya, onye ụkọchukwu na-elekọta otu jikọtara ndị nna n'ime dayọsis ahụ, bụ ‘Canon’ Vincent Nkemdilim kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kèléé Ashbishọp Ibezim maka ezi ọrụ ya na dayọsis ahụ nà nkwàdo dị icheiche ọ na-enye òtù ndị nna, ọbụladị dịka o tinyekwàrà olu nke ya wee kpọkuo ndị nna ka ha bụrụ ndị agha ekpere ma bụrụkwa ndị e ji ama àtụ n'obodo, ndị a na-elegara anya, na ndị a na-eñòmi èñomi n'ihi ezi akparamagwa ha.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onyeisi òtù ndị nna na dayọsis ahụ, bụ Maazị Emmanuel Nwosu; onyeisioche otu haziri mmemme ahụ, bụ Maazị Nathaniel Anigbo; onyeisi òtù ‘Rotary Club’ na Mahadum Nnamdị Azikiwe, bụ Maazị Abuchi Nwozor, bụkwa ndị kpọkuru ndị nna ka ha na-ekpesi ekpere ike ma jirikwa ekpere hiri isi, n'ihi uru dị icheiche dị na ya.

Ya bụ mmemme dọ̀tàrà onyeisi otu jikọtara ndị nne na ụmụagbọghọ n'ime dayọsis ahụ, ma bụrụkwa nwunye Ashbishọp Ibezim, bụ Oriakụ Chioma Ibezim; ndị nna sitere ime Ashdikinri iri na asatọ dị na dayọsis ahụ.

A nọkwazịrị na ya bụ mmemme nyee onyinye ịtụ mmamma site n'aka ndị nna ahụ, ma kpekwa usoro ekpere dị icheiche; ebe Ashbishọp Ibezim nọkwàzịrị ebe ahụ kwuwaa na a ga na-emezị ya bụ mmemme kwà ahọ ọbụla na dayọsis ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484