Gọvanọ Obiano Eguzobela Òtù Ga-ahụ Maka Ikike Dịịrị Ndị Ahụ Ézuchàghị Òkè

Feb 6, 2022 - 12:59
 0
Gọvanọ Obiano Eguzobela Òtù Ga-ahụ Maka Ikike Dịịrị Ndị Ahụ Ézuchàghị Òkè

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ eguzobela òtù pụrụ iche ga na-ahụ maka ichekwaba ikike dịịrị ndị nwere ọlụsị na steeti ahụ, bụ nke a kpọrọ ‘Anambra Disability Rights Commission’.

Ya bụ mmemme iguzobe ndị ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị dị icheiche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ nà ọtụtụ ndị ọlụsị (bụkwa ndị a maara dịka ndị ikedịnobi).

Ya bụ u òtù ọhụrụ mmadụ iri nọ na ya nwèrè Ọkaiwu Chuks Ezewuzie dịka onyeisioche ya; nwee Ọkaiwu Chinenye Okeke dịka odeakwụkwọ ya, ebe mmadụ asatọ ndị ọzọ gụnyèrè Bishọp Moses Ezedebego, Ugochukwu Okeke, Oriakụ Victoria Okonkwo, Maazị Tony Oli, Dọkịta Pat Okeke, Oriakụ Eucharia Anekwe,  Maazị Williams Umeh, na Oriakụ Anthonia Obianyo.

N'okwu ya oge ọ na-eguzobe ndị òtù ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàrà na a họpụtara ha ịbụ ndị òtù ahụ n'ihi ezi ntụkwasịobi e nwere na ha, ya na ihe ha pụrụ ime, ọkachasị dịka o siri metụta imezupụta ebumnobi e jiri guzobe ya bụ òtù. Ọ gakwara n'ihu kpọkuo ha ka ha wepụta ezigbọ usoro na atụmatụ ga-enyere gọọmenti aka n'ezi mbọ ọ na-agba ichekwaba ikike dịịrị ndị ọlụsị n'ime steeti ahụ, ya na ịkwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ha.

Dịka ọ na-echetara ha na nwere ahọ anọ dịka àgbà nke mbụ ha ga-anọgodi n'ọkwa ahụ dịka ndị nlekọta òtù ahụ, ọ kọwakwààrà ha n'ebe o doro anya, ihe a na-atụ anya n'aka ha, ma dụkwazie ha ọdụ ka ha tinye ọkachamma ha n'ọrụ ahụ, iji mezupụta ya bụ ntụkwasịobi na atụmanya e nwere n'ebe ha nọ. 

O kwekwazịrị nkwà na gọọmenti ga-aga n'ihu inye ha nkwàdo kwesiri ekwesi n'ụzọ zuru òkè, ya na inyekwa ha ezi ntụziaka ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma.

Na ntụnye nke ya, odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kọwara na ọ bụ n'ahọ 2018 ka e binyere aka n'amụma iwu kwadoro nguzobe òtù ahụ, ma kpọpụtasịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị icheiche ọchịchị Gọvanọ Obianọ mepụtagoro n'ihe gbasaara ịkwàlite ikike dịịri ndị ọlụsị nàkwà ezi ọnọdụ obibindụ ha, ọkachasị site n'ịrụgharị ebe dị icheiche a na-elekọta ndị nwere ọlụsị, itinye ọtụtụ n'ime ha tozuru òkè (karịrị narị anọ n'ọnụọgụgụ) n'ọrụ gọọmenti, na ịkpọlite ọtụtụ n'ime ha tozùkwàrà òkè n'ọkwa dị icheiche dị elu n'ọrụ gọọmenti.

Na nzaghachi ya n'aha ndị òtù ya oge e guzobèchara ha, onyeisioche ndị òtù ahụ ma bụrụkwa onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndị ọlụsị, bụ Ọkaiwu Ezewuzie gbàkwàrà akaebe ihe ọchcịchị nọ ugbua na steeti ahụ megooro ndị ọlụsị, ma kelekwa ya n'ụzọ pụrụ iche maka nke ahụ. Ọ kọwara Gọvanọ Obianọ dịkà enyi ndị ọlụsị, mee ka a mara na ya bụ gọvanọ tinyèkwàrà ndị ọlụsị n'amụmà ego ọrụ steeti Anambra nke ahọ 2021 mà kwàlitekwa nkwàdo a na-enye ha nà mbọ a na-agba iji kwalite ikike dịịrị ha, bụkwazị isi sekpụ ntị n'òtù ahụ o guzobere ụbọchị ahụ.

Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị icheiche otu ahụ ga-aba n'ibèlàtà mmekpaahụ a na-emekpà na mmegide a na-emegide ndị nwere ọlụsị, Maazị Ezewuzie gosipụtakwara olileanya o nwere na oge adịghị anya na steeti ndị ọzọ ga na-abịazị n'Anambra ịmụtà na ilere anya etu e si emesò ndị ọlụsị. O kelekwazịrị gọọmenti maka ịhụta ha dịka ndị tozuru òkè ịnọ n'òtù ahụ, ma kwezie nkwà na ha ga-arụ ọrụ ahụ a hanyèrè ha n'aka nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee nwee ịgba nkịtị otu nkeji maka nwa amadi ahụ kpuru ìsì, bụ Maazị Mmadụabuchi Nnofu, bụ onye obere nwanne ya nwoke bụ Onyedịka Nnofu gburu ma mụọ ya ọkụ n'Ekwulobịa ụbọchị ụka gara aga n'ihi ala ha na-azọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484