N'Anambra, Nwoke Egbuola Nwanne Ya Kpuru Ìsì Maka Àlà Ha Na-Azọ

Feb 2, 2022 - 19:58
 0
N'Anambra, Nwoke Egbuola Nwanne Ya Kpuru Ìsì Maka Àlà Ha Na-Azọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị òtù ahụ jikọtara ndị nwere ọlụsị (bụkwa ndị ikedịnobi) n'ala Nigeria, bụ ‘Joint National Association of Persons with Disability (JONAPWD)’, ngalaba ya nke steeti Anambra akpọọla ka e nwee ikpe nkwụmọtọ maka onye òtù ha kpuru ìsì, bụ Maazị Maazị Mmaduabuchi Nnofu (gbara ahọ iri anọ na asaa), onye nwanne ya nwoke gburu na nsonso a.

Nke a bụ nke e kwupụtara n'ozi a kụpụrụ site n'aka ndị òtù ahụ, bụkwa nke onyeisioche òtù ahụ n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Ugochukwu Okeke E.C.; onye na-ahụ maka mgbasaozi òtù ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Igwegbe; na onye ndụmọdụ ndị òtù ahụ n'ihe gbasaara iwu, bụ Ọkaiwu Peter Muoneke bìnyèrè aka na ya.

Ha kọwàrà na Maazị Nnofu ahụ e gburu egbu bụ onye obodo Eziagulu dị n'Ekwuloboa, n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onyeisi òtù JONAPWD n'ime okpuruọchịchị Aguata. Ha mekwara ka a mara na ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ Maazị Onyedika Nnofu bàtàrà n'ụlọ be ya ebe ọ na-ezùrú onwe ya ike, wee gbuo ya n'ihi na ha abụọ na-enwe okwu gbasara ala.

E kwuru na nwanne ya nwoke ahụ sùkwàrà ozu ya ọkụ oke o gbuchara ya.

N'ozi ahụ ndị ahụ kụpụrụ, ha mèrè ka a mara na oge ọ nọ ndụ, na Maazị Mmaduabụchi nwèrè mgbe ọ gwara ha na o nwere àlà ya nwanne ya nwoke na-achọ ịnara ya n'ike ka o ree ya, bụkwazị nke megoro ka ha nwee okwu.

Ha sị na ọ gwara ha na ọ bụ àlà nna ha jiri aka ya wee nye ya onwe ya oge ọ dị ndụ, ma nye nwanne ya nwoke ala nke ọzọ dị n'azụ nke ya; mana nwanne ya nwoke ahụ jizị anyaukwu na aka ike wee na-achọ ịnara ya ala nke ya ahụ, n'ihi na o kpùrù ìsì, o nweghị onye enyemaka maọbụ onye ga-ekwuru ya, tinyekwuoro na ọ lụghị nwaanyị, ma ya fọdụzịe ịmụta nwa.

Ha kwukwara na e nwebụọla mgbe ya na nwanne ya nwoke ahụ jiri maka okwu àlà ahụ wee gaa ụlọikpe, mana ụlọikpe sị ha were okwu ahụ làá n'ụlọ gaa kpeziere onwe ha. Ọ bụzị n'ime oge ahụ a na-eche ma na-agbasi mbọ ike ikpezi okwu ahụ n'udo ka ha nwetazịrị ozi ọjọọ ahụ na e gbuola Mmadụabụchi ma gbaa ya ọkụ 

Ha katọrọ nke ahụ dịka ihe jọgburu onwe ya, ma hụtakwa ya dịka nke adabàghị adabà n'isi iwu nke iri na ise (Article 15) nke atụmatụ iwu United Nations Charter, isi nke 21(1b) nke amụmà iwu steeti Anambra gbasaara ikike dịịrị ndị ọlụsị (2018), tinyere isi nke 33 na 43 nke iwu na-achị ala Nigeria.

Ha jikwàzị̀ ohere ahụ kpọkuo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ime steeti Anambra ka ha mee ngwangwa nwụchie ya bụ nwa amadi kpara agwà ọjọọ a, mee nnyocha banyere okwu ahụ, ma kpụpụ ya ụlọikpe, ya na ndị òtù ya, ma ọ bụrụ na e nwere ndị ọzọ ya na ha gbara ìzù wee rụọ arụrụala ahụ. 

Ha kpọkukwàrà gọọmenti steeti Anambra, ndị òtù mba ụwa dị icheiche, na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù, rịọ ha ka ha bàtá ma tinye ọnụ n'okwu ahụ, iji hụ na e nwetere ikpe nkwụmọtọ n'isi onye òtù ha ahụ, bụ Mmadụabụchi lagoro mmụọ.

Kaosiladị, ụlọọrụ uweojii steeti Anambra emeela ka a mara na ha anwụchielarị nwa amadi ahụ, bụ Maazị Onyedika Philp Nnofu a na-enyo ènyò na ọ bụ ya gburu nwanne ya.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Tochukwu mèrè ka a mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ ụbọchị Mọnde. Ọ kọwara na a ka nà-enyòcha ma na-agba ya bụ nwaokorobịa ajụjụọnụ ugbua, ma kwe nkwà na a ga-emekwa ka ọhaneze mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ na ya bụ okwu n'ọdịnihu.

O kwukwàrà na onyeisi ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng akpọọla òkù ka onye ọbụla wetuo obi, ma kwe nkwà na a ga-eme nnyocha miri èmì banyere okwu ahụ, iji hụ na e nwetere ikpe nkwụmọtọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484