N'Anambra, Echeng Ejiela Ndị Uweojii E Buliri n'Ọkwa Ọhụrụ Ejiji

Feb 2, 2022 - 20:16
 0
N'Anambra, Echeng Ejiela Ndị Uweojii E Buliri n'Ọkwa Ọhụrụ Ejiji

Izunna Okafor dere akụkọ a


Igbo sị na ezi ọrụ nwèrè ezi ụgwọ; ma sịkwa ọ na-abụ onye e nyèrè mara jide, e nyekwuo ya nke ka nkè. 

N'ịgbaso nke a, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng ejiela ndị uwe lojii ruru mmadụ iri asatọ na atọ (83) n'ọnụọgụgụ ejiji ọhụrụ ma chọkwa ha mma, bụ ndị e buliri ha n'ọkwa ọhụrụ dị icheiche.

Mmemme iji ndị ahụ ejiji ọhụrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke e mere n'ịgbasò ntụliaka ahụ onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman nyere ka e bulie ụfọdụ ndị uweojii n'ọkwa na nsonso a, bụkwa nke e mèrè site n'aka ụlọọrụ ‘Police Service Commission (PSC)’.

Mbuli n'ọkwa ọhụrụ ahụ, dịka o siri dòó anya, bụ otu n'ime ụzọ isi ọchịchị ụlọọrụ ndị uweojii n'ala Nigeria si ágbà ndị uweojii ume ka ha na-arụsi ọrụ ike; ma bụrụkwa nke a na-agbaso usoro kwesiri ekwesi na usoro ntozùòkè wee na-eme.

N'okwu ya oge ọ na-eji ha ejiji ọhụrụ ahụ, Maazị Echeng tòrò ndị ahụ e buliri n'ọkwa ọhụrụ, ma chètara ha na ọ bụ site n'ezi ọrụ ha nà ihe ha rụpụtara n'ọrụ ka ha jiri nweta mbuli n'ọkwa ahụ. O nyezịkwara ha ndụmọdụ ka ha jisie ike karịa n'ịrụ ọrụ ha, ọkachasị ugbua e buliri ha n'ọkwa, iji were ọkwa ọhụrụ ha ahụ rụpụta ihe a hụrụ anya karịa ka ha na-eme na mbụ.

O chetekwààrà ha na o nwere ụfọdụ ihe a na-atụzị anya ya n'aka ha ugbua n'ihi ọkwa ọhụrụ ahụ ha nọ̀zị̀ na ya, ma nwekwa ụfọdụ ihe e kwesighịzị ịdị na-ahụta ebe ha nọ na n'ebe ịrụ ọrụ ha dị.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu n'aha ndị ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị ahụ e buliri n'ọkwa ọhụrụ, nke gụnyere SP Stephen Ewa, SP Joy Yusuf, na ASP Mike Ugwu kèlèrè isi ọchịchị ndị ọrụ uweojii ala Nigeria, onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman, na onyeisi ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ CP Echeng maka ịhụta ha dịka ndị tozuru òkè iso rite uru na mbuli n'ọkwa ahụ, nà inye ha ọmarịcha òhère ahụ iji jeere ala nna ha ozi n'ogoogo dị elu. 

Ha kwukwazịrị na nke ahụ ga-abụ nnọọ ihe mwuli mmụọ na ihe agbamume nyéré ha. Ha kwèrè nkwà na ha agaghị agharịpụ ma ọ bụ kpụọ ùgwù dịịrị ọrụ ahụ n'ala, ọbụladị dịka ha kwezịrị nkwà na ha ga-eji ọkwa ọhụrụ ahụ e nyere ha wee rụsie ọrụ ike ma mepùtekwa ihe a hụrụ anya, karịa ka ha mèrè na mbụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484