NDLEA Anwụchiela Nwoke India Maka Ibubata Ọgwụike na Nigeria

Feb 19, 2022 - 21:35
 0
NDLEA Anwụchiela Nwoke India Maka Ibubata Ọgwụike na Nigeria


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ, ịñụ, maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA’ anwụchiela otu nwoke bụ onye mba India maka ibubàtà karama ọgwụike Codeine ruru otu narị puku na iri atọ na anọ na narị asaa (134, 700) n'ọnụọgụgụ n'ala Nigeria site na nzuzo.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Femi Babafemi siri kọwaa, nwoke India ahụ aha ya bụ Vyapak Nutal, bubàtàrà ọgwụike ahụ na nzuzo site n'ebe ala Nigeria na mba Niger Republic gbara agbataobi, dị na steeti Sokoto.

Ọ kọwara na nwoke ahụ bụ onye na-azụ ahịa, ma bụrụkwa onye kwajubere ọgwụike ahụ n'ime ọtụtụ ụgbọala gwongworo na Cotonou dị na mba Benin Republic, e wee si ebe ahụ bukọrọ ha gafee mba Nigeri Republic, wee bata steeti Sokoto site n'ókè ala ebe iwu akwadòghị.

Ọ kọwara na nwoke ahụ nọzị n'otu ụlọ nkwariakụ dị na Sokoto ebe ọ na-ezuru onwe ya ike wee na-achọkwa ndị ga-azụrụ ya bụ ọgwụike, tupu ndị ọrụ nchekwa ‘Department of State Security (DSS)’ wee chọrọ ya bịa n'ebe ahụ ma nwụchikọọ ya, wee nyefèzie ya n'aka ndị ọrụ NDLEA.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, ndị ọrụ NDLEA nwụchikọkwara ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ isi n'ọdụ ụgbọelu mba ofesi ‘Murtala Muhammed International Airport (MMIA)’ dị na Lagos wee buru ọgwụike gaa mba ofesi, ma nwetesikwa ọtụtụ ụdị ọgwụike dị icheiche n'aka ha, nke gụnyere ọgwụike Heroin, Methamphetamine, Khat, Tramadol na Cannabis.

O kwuru na ndị ahụ e jidere ebe ahụ gụnyèrè Maazị Felix Rotimi Eshemokhai (onye e nwetere ọgwụike heroin ike arọ ya ruru 1.75kg, bụkwa nke ọ chọrọ ibu wee gaa Casablanca dị na mba Morocco), Maazị Okafor Emmanuel Onuzuruike (onye e nwetere ọgwụike cannabis ike arọ ya ruru 2.2kg, bụkwa nke o zoro n'ihe nri ma chọọ ibu ya gaa mba Dubai, tupuu e wee nwụchikọọ ya).

E nwetesikwara ọgwụike Methamphetamine ike arọ ya ruru 25kg, Tramadol, Cannabis na Khat e zoro n'ime ihe e ji akpọ egwu wee na-achọ ibupù ha mba USA, UK, Australia, Dubai na Madagascar n'ụfọdụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịnata na izipu ngwaahịa. 
 
Na steeti Gombe, e jidekwara Maazị Ibrahim Tukur Bage, onye e nwetere mkpụrụ ọgwụike ruru puku iri na otu n'ọnụọgụgụ, bụ nke nke e tinyere n'ụgbọala gwongworo ma si Onitsha dị na steeti Anambra buru ya wee na-aga Mubi dị na steeti Adamawa. Nke ahụ mere ka e jidechara Maazị Aliu Salami gbara ahọ iri anọ na atọ ma nwetekwa ọgwụike cannabis ike arọ ya ruru 143.9kg n'aka ya.

Ndị ọrụ NDLEA ahụ jidesikwazịrị ụfọdụ ndị ọzọ na-atụ mgbere ọgwụike na mpaghara steeti ndị ọzọ dị icheiche, nke gụnyere steeti Kwara, steeti Kastina, steeti Benue, steeti Borno, na steeti Adamawa, ma bụrụkwa ndị e nwetegasịrị ụdị ọgwụike dị icheiche, ọgwụ a gwọrọ agwọ, égbè, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ n'aka ha.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484