Kọmishọna Odimegwu Agaala Njem Nleta Ebe A Na-Ejikwa Atịtị n'Anambra

May 14, 2022 - 19:21
 0
Kọmishọna Odimegwu Agaala Njem Nleta Ebe A Na-Ejikwa Atịtị n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


N'ịga n'ihu n'ezi ọrụ ya ịkwalite adịmọcha gburugburu na njikwa atịtị na steeti Anambra, Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, bụ Injinia Felix Odimegwu agaala njem nleta n'ogige akụrụngwa ebe a na-ejikwa ma na-agbanwègharị atịtị na steeti ahụ bụ nke a maara dịka ‘waste recycling plants’ nke ụlọọrụ Boskel dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Kọmishọna Odimegwu kwuru na ebumnobi o jiri bịa bị iji hụ etu ya bụ akụrụngwa si arụ ọrụ, ike ya nàkwà ogoogo ọrụ ya n'ịgbanwègharị atịtị ka ọ ghọọ ihe bara uru.

O kwuru na steeti ahụ agbagotela n'ogoogo ịgbanwè atịtị dị icheiche e nwetere na steeti ahụ ka ọ ghọọ bara uru ma jirikwa ya mepụtegharịa ihe ọzọ, karịa ịla ya n'iyi. 

Ọ kpọkuzịrị ụlọọrụ mba ụwa dị icheiche nọ n'ọrụ ijikwa atịtị ka ha bịa maka nkwekọrịta na njikọaka n'ọrụ n'ihi na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Soludo dị gbasapụrụ aka ma njikere ịnabata ha, ya na iwèta ezi mgbanwè n'usoro ochie e sigasị ejikwa atịtị na steeti ahụ, iji wetara ndị Anambra ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà ma dịkwa mma obibi.

O mere ka a mara na steeti ahụ dịkwa nkwadobe maka ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọọrụ ọbụla ma nke ekwe na-akụ n'ijikwa na ịgbanwègharị atịtị ka ọ ghọọ ihe bara uru, bụkwa nke o kwuru na ọ pụrụ ikepụtara ụmụafọr steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, kwalite ezi adịmọcha ma wetekwa mmepe tọrọ àtọ na steeti ahụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Keluo Chukwuogo kelere Kọmishọna ahụ maka etu o siri za oke a kpọrọ ya ngwangwa ịbịa leta akụrụngwa ahụ na etu ha si arụ ọrụ, ọbụladị dịka o kwuru ya bụ ụlọọrụ wàtàrà ọgọdọ inye aka na mmezupụta ezi ebumnobi dị icheiche ọchịchị steeti ahụ nwere n'ihe gbasaara ijikwa na ịgbanwègharị atịtị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484