Ihe pụtara na nzụkọ udo ndị Ipob na Ohaneze mere

Jul 21, 2020 - 17:05
Jan 26, 2021 - 17:06
 0
Ihe pụtara na nzụkọ udo ndị Ipob na Ohaneze mere

By Chidimma Nwogu, VON

Ohaneze na ndị otu Indeginous People Of Biafra (Ipob) akọwala ka ha siri kpee udo dịka Mbazulike Amechi kpọrọ otu abụọ a nzụkọ na bee ya.

Ọ bụ maka iwu Nnamdi Kanu nyere ka ndị Ipob ọbụla hụrụ Mazị Nnia Nwodo tụọ ya okwute.

Otu abụọ a kwetere na ha zutere ma kpee udo kama ọtụ ọzọ kpọrọ onwe ha Ohaneze General Assembly ekwuola na ọ bụghị ohaneze biara nzụkọ a.

Nnia Nwodo bụ onyeisi ohaneze ndị Igbo gwara ndị BBC Igbo na ọ bụghị okwu ohaneze ọbụla ka o na-etinye ọnụ ya mere ọgaghị ekwu ihe ọbụla gbasara okwu mkpezi a.

Onye okaiwu ndị otu Ipob na nke Nnamdị Kanụ bụ Aloy Ejimako kọwara na mgbe ha gara ya bụ nzụkọ, na ọ bụ Damian Okeke-Ogene dụ ndị Ohaneze bia.

O kwukwara na ọ bụ Nnia Nwodo zitere ha ka ha nọchite anya Ohaneze na ya bụ nzụkọ.

Aloy kwuru na isi ya bụ nzụko bụ maka okwu mazị Kanu kwuru ebe ọ nyere iwu ka ndị otu Ipob tụọ Nwodo okwute ebe ọbụla ha hụrụ ya.

O kwukwara na Kanu ekwugharịala ihe o kwuru ma sị ka onye ọbụla hara ịtụ Nnia Nwodo okwute.

Kama ndị Ipob gwara ndị Ohaneze ka ha gwa ndị gọvanọ steetị ọwụwa anyanwụ ka ha gbaa mbọ wepụ mmachi amachiri ndị Ipob dịka ndị otu oyi egwu.

Ha kọwara na-enweghị etu ndị Ohaneze na ndị a kpọrọ ndị oyiegwu ga-esi enwe mmekọ ziri ezi.

N’otu aka ahụ ka Okeke-Ogene na-ekwu na ha e kpeziela ma sịkwa na ọrụ onyeisi ha bụ Nwodo bụ ihụ na ndị Igbo ketere oke nke ha, na ọrụ ya abụghị ikewapụ ala Igbo na Naijirịa.

Mana mazị Emejulu Okpalukwu Okpaleze bụ onye ọnụ na-eru n’okwu nke otu kpọrọ onwe ha “Ohaneze General Assembly” kwuru na ọ bụghị Ohaneze biara ya bụ nzụkọ.

Ọ kọwara na ndị biara ya bụ nzụko ma onye zitere ha bụ ndị na-achọ itisa Ohaneze ma jiri kwa Ohaneze azota elele ndọrọndọro ọchịchi nanị ha ga-erite.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.