Gọọmenti Anambra Agbachiela, Wèghara Ebe Ahụ Ọkụ Gbara n'Onitsha

Dec 16, 2021 - 21:14
 0
Gọọmenti Anambra Agbachiela, Wèghara Ebe Ahụ Ọkụ Gbara n'Onitsha

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ; maka na na agadinwaanyị kachie nrị wụọ aja, e bute ozu ya n'ofe nke ọzọ.

Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti Anambra agbachiela ma wègharazie ebe ahụ ọkụ ọgbụgba dị egwu gbara n'ọdụ mmanụ ụgbọala n'Onitsha na nsonso a.

Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ, bụ ya kwuwàrà nke a oge ọ gara n'ebe ahụ ya bụ ihe mere ka o jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri dị n'ebe ahụ.

Ọ dị ncheta na ọkụ ọgbụgba dị óké egwu dapụtara na mpaghara Borromeo dị n'Onitsha, n'abalị ụbọchị ụka, abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba a, wee gbarikọọ ọdụ mmanụ ụgbọala abụọ, gbarìkọkwa ụlọ mmadụ dị na mpaghara ebe ahụ.

Ọ dịkwa ncheta na ọchịchị steeti Anambra nwere nkwuwaokwu na gọọmenti ga-ewèghara ebe ọbụla ụlọ dara maọbụ ọkụ ọgbụgba dapụtara na steeti ahụ n'ihi adịghị uchu na akpachàpụghịanya nke ndị mmadụ.

Ọ bụzị n'ịgbaso nke a ka ọchịchị steeti ahụ jiri gbachie ma kwuwaa na gọọmenti ewègharala ya bụ ọdụ mmanụ ụgbọala 'Chris Tee and Silver Filling Station', bụ ọdụ mmanụ ụgbọala ebe ọkụ ọgbụgba ahụ siri wee malite n'abalị ụbọchị ụka ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kwùrù na ya nwetara ozi na ọkụ ahụ malitere oge a na-agbapụ ikuku mmụọ gaasị e ji esi nri n'ọdụ mmanụ ụgbọala ahụ. Ọ nọkwazịrị n'ebe ahụ nye ndị ọrụ nchekwa ntụziaka ka e mechie ọdụ mmanụ ụgbọala ọbụla a rụnyere ebe a na-ere gaasị e ji esi nri n'ime ya.

Kaosiladị, o gosipụtara obi añụrị o nwere na o nweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ tụfuo ndụ ya n'ihe ọdachi ahụ, ya na etu ndị ọrụ nsọnyụọkụ siri gbata ọsọ ozigbo n'ebe ahụ, wee buso ya bụ ọkụ agha ma mechaa gbanyụọ ya

Ụfọdụ ndị dị icheiche soro Gọvanọ wee gaa ya bụ njem nleta n'ebe ahụ n'ụbọchị ahụ gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Onitsha nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Eddy Ibuzo; onyeisioche nchereoge n'okpuruọchịchị ime obodo Onitsha North; onyeisi ụlọọrụ nsọnyụọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Martin Agbili; nnukwu onyemaka pụrụ iche nyegara Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara mmanụ ụgbọala, bụ Maazị Peter Nwosu, tinyere ụfọdụ ndịisi ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ, bụ ndị gara n'ebe ahụ ịnabata gọvanọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484