Ihe ikwesiri ima banyere Nwafor Orizu

Jul 18, 2020 - 17:02
Jan 26, 2021 - 17:03
 0
Ihe ikwesiri ima banyere Nwafor Orizu

By Chidi Igwe, VON

A mụrụ Ọkparaeze Akweke Abyssinia Nwafor Orizu n’afọ 1914 na Nnewi dị n’steeti Anambara.

  • Ọ bụ nwa nwoke nke ise nke Obi Nnewi bụ Igwe Orizu, Eze Ụgbonyamba nke mbụ na nwunye ya mụrụ
  • Ọ gara ọtaakara na ụlọakwụkwọ ndi ụka St. Thomas dị n’Otolo, Nnewi, gaa praịmarị n’Ụlọakwụkwọ Central dị n’Ọnịcha ma gakwaa Sekọndịrị na CMS Central dị na Nkwọ, Nnewi
  • Na CMS Central ahụ ka ọ nọ malite ikuzi nkuzi
  • O si ebe ahụ gaa Achimota Kọleji dị na mba Gana, tupu ọ gaa na Mahadum Lincoln, Mahadum Ohio Steeti, Mahadum Columbia nakwa Mahadum New York dịcha na mba Amerịka
  • Na mahadum nke Ohio Steeti, ọ gụrụ Iwu Ọha na Gọọmentị, ebe ahụ ka ọ nọ mgbe o dere akwụkwọ mbụ ya bụ “Without Bitterness”. O mechara dee ihe ruru akwụkwọ iri ọzọ na ndụ ya
  • Aha otutu ya bụ “Orizontal”
  • O mechara nwee ebe a na-ebiputa akwụkwọ nakwa ụgbọala e ji eme njem
  • O hibere otu na-ahụ maka ụmụakwụkwọ si mpaghara Afrịka a kpọrọ African Students Association nakwa nke a kpọrọ American Council on African Education (ACAE). Ọrụ ACAE bụ maka ịchọta ohere ka ụfọdụ ndị si Afrịka gaa akwụkwọ n’efu.
  • O tinyere ezigbo uchu n’ihe gbasara ịchụ nta ego a ga-eji zụọ ụmụ Naịjiria akwụkwọ n’Amerịka karịa na Briten, n’efu
  • O so na ndị gara mgbaru n’Enugwu steeti n’ihi ọnwụ mmadụ iri abụọ na otu n’egwu Coal,bụ ndi ndi ọcha gburu na Iva Vally di n’steeti Enugu ma gosi nkwado ya.
  • Mgbaru a ọ gara so butere ya nsogbu, n’ihi na dịka akụkọ si kwuo, ndị ọchịchị mba Briten ji n’ihi ya bo ya ebubo nrụrụaka n’ihe gbasara ego ACAE. E ji maka ya tụọ ya nga afọ asaa
  • O so na ndị hụrụ na e hibere otu ndorondoro National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC)
  • Ka ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị, o bu ụzọ bụrụ “chief whip” n’ụlọomeiwu ndị Ọwụwa-Anyanwụ, ebe ọ nọchitere anya ndị mpaghara Ọnịcha
  • Ọ bụ onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu nke atọ Naịjiria nwetara ka ha natachara nnwereonwe n’aka mba Briten n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba,n’afọ 1960
    Ọ nọrọ n’ọkwa ahụ site n’ọnwa Nọvemba 1963 ruo n’ọnwa Jenụwarị 1966
  • O mechara bụrụ onye na-arụtu ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa, mgbe Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala mgba ahụ gawara mba ofesi.
  • N’ọnọdụ a ka ọ nọ site n’ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọktoba 1965 ruo abali iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 1966, mgbe ndị agha ji ike weghara ọchịchị
  • Ọ laghachiri Nnewi ka ọ pụrụ n’ọchịchị, ebe ọ gara tinye uchu n’ihe gbasara agụmakwụkwọ ọzọ
  • Ọ nwụrụ n’afọ 1999, mgbe ọgbara afọ iri asatọ na ise (85)

Nwafor Orizu malitere ihe a kpọrọ “Zikist Movement”

Ihe ndị e ji echeta ya bụ:

  • Mahadum pụrụiche maka ndị Nkuzi nke a na-akpọ Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe, Anambara steeti
  • E nwere Nwafor Orizu street n’Independence Layout dị n’Enugwu steeti
  • E nwekwara ụzọ ya n’Apo dị n’Abuja

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.