Gọọmenti Anambra Azọpụla Ụkwụ Imemìlà Ọrịa Ịba Ọchananya

Jul 29, 2020 - 17:44
Jan 26, 2021 - 17:45
 0
Gọọmenti Anambra Azọpụla Ụkwụ Imemìlà Ọrịa Ịba Ọchananya

By Izunna Okafor

Gọọmenti ọchịchị steeti Anambra ekwupụtala ezi njikere ya ibuso ọrịa ịba ọchananya agha na steeti ahụ, na ịchụ ya ọsọ ụkwụ erughị ala n'ime steeti ahụ.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Okpala, n'okwu ọ gwara ndị nta aụkọ na mmemme imerùbè ụbọchị ọrịa ịba ọchananya na mba ụwa, bụ nke a chịkọbara n'isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ dị n'Awka.

Ọ kọwara ịba ọchananya dịka ọrịa jọgburu onwe ya, ma kpọpụtasịa ụzọ dị iche iche a pụrụ isi bute ya, nke gụnyere site na mmekọ nwoke na nwaanyị, site na mmetụkọrịta ọbara site n'ihe dị nkọ, site n'afọ nwaanyị nwere 'Hepatitis B', oge ọ mụrụ nwa, tinyere ụfọdụ ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi kesàá ya bụ ọrịa. O kpọpụtasịkwara ụfọdụ n'ime njirimara ọrịa ahụ.

N'iji gbochie mgbasa ya bụ ọrịa, Dọkịta Okpala nyekwazịrị ndụmọdụ ka ndị mmadụ kwụsị ime ụfọdụ ihe dị iche iche ha na-eme, dịka íbì úgwù ezighị ezi, igbu ichi, ijikọrịta ihe dị nkọ were eme ihe, tinyere ihe ndị ọzọ dị etu ahụ. Ọ dụkwara ndị mmadụ ka ha na-eji okpunnabụenyi were akwa iko n'ụzọ kwesiri ekwesi, ma gwakwa ha ka ha na-agba ụmụ ha ọgwụ mgbochi ọrịa oge ọbụla.

Dịka o siri kọwaa, gọọmenti ga-amalitekwa inyòchà ụmụnwaanyị dị ime ahụ n'ime ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ ma na-agbakwa ha ọgwụ tupu ha amụọ nwa, iji gbochie mgbasa ọrịa ahụ site n'afọ nne. O kwuru na nke ahụ so n'otu n'ime mbọ gọọmenti steeti ahụ na-agba iji chụọ ọrịa ahụ ọsọ na steeti ahụ, ma nyekwazie owuweanya na steeti ahụ ga-abụ ndị mbụ ga-emezupụta amụmà ahụ gọọmenti etiti wepụtara bànyere ọrịa ịba ọchananya, bụ nke a kpọrọ 'Federal Government National Hepatitis Policy'.

Dịka nnyocha siri kọwaa, mmadụ karịrị narị nde abụọ na iri iteghete nwèrè ọrịa ịba ọchananya na mba ụwa n'amaghị na ha nwèrè ya bụ ọrịa, ebe mmadụ karịrị nde iri abụọ nwèrè ya n'ala Nigeria. 

Ụbọchị ịba ọchananya na mba ụwa bụ nke a na-emerùbe n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke e wepụtara site n'aka ụlọọrụ ahụike mba ụwa 'World Health Organisation'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.