Okeke Eletela Ka Ọrụ Si Aga n'Ụlọ Ezùméèzù Mba Ụwa A Na-Arụ n'Awka

Jul 29, 2020 - 17:47
Jan 26, 2021 - 17:48
 0
Okeke Eletela Ka Ọrụ Si Aga n'Ụlọ Ezùméèzù Mba Ụwa A Na-Arụ n'Awka

By Izunna Okafor

Osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke bagidère na njem nleta n'ogige ebe ahụ gọọmenti steeti ahụ na-arụ ụlọ èzùméèzù mba ụwa n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, ya na iji leruo anya n'akụrụngwa ọhụrụ dịgasị iche iche e bulatara n'ebe ahụ na nsonso a, maka iji kụọ elu ụlọ ahụ.

Njem nleta ahụ bụ nke Dọkịta Okeke mere na nsonso, ma bụrụkwa nke Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Michael Okonkwo sonyere na ya, bụ onye dugharịrị ya n'ogige ahụ ma kọwaara ya ka ọrụ siri gbata kwụrụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Okeke gosipụtara obi añụrị ya bànyere etu ọrụ si agawanye n'ihu n'ebe ahụ, ma gosipụtakwa afọ ojuju ya n'ogoogo akụrụngwa ọhụrụ ahụ e bulatara.

Ya bụ akụrụngwa ígwè nke a ga-eji wee kụọ elu ụlọ ahụ gbamgbam, ka Dọkịta Okeke mere ka a mara na ọ ga-enye aka ime ka a gbapụ ọrụ ahụ ọsọ.

O kwupụtazịkwara ezi olileanya o nwere na ọrụ ga-akụrụ ọnọ n'ebe ahụ tupu isingwụcha ahọ a, ọbụladị dịka ọ kpọkuzịrị ụlọọrụ ji ọrụ ahụ ka welitekwuo aka, iji hụ na a rụchapụrụ ya bụ ọrụ n'oge a tụrụ anya na a ga-arụcha ya.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisi ụlọọrụ ji ọrụ ngo ahụ, bụ Injinia Abiola Kolawole mere ka a mara na akụrụngwa ọhụrụ ndị ahụ e bụlatagodiri bụ kọntena ngwaọrụ iri na ise n'ime kọntena ngwaọrụ iri ise na isii a ga-ebulata n'ogige ahụ maka ya bụ ọrụ.

O nyekwazịrị owùwèanya na kọntena ngwaọrụ iri anọ na otu fọrọ afọ ga-abata n'ọdịnso a, ma kwe nkwa na ụlọọrụ ahụ ga-agbasi mbọ ike ma welitekwuo aka n'ọrụ, iji hụ na ha rụchapụrụ ya n'oge a tụrụ anya, nawka n'ogoogo dị elu.

Ọ dị ncheta na ọchịchị steeti Anambra nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n'isi ya, nọrọ n'ọnwa ekeresimeesi ahọ 2018, wee gbapee ma malite ọrụ ụlọ èzùméézù mba ụwa ahụ, bụ nke ga-abụ nke mbụ na mbụ ya a na-arụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

Ya bụ ụlọ ezumeezù, nke ga na-abàtakwa mmadụ ruru puku iri ise n'ọnụ ọgụgụ ma a rụchaa ya, ga-enwe òkpùkpù iri, nwee gbamgbam ogo ya ga-eru mità iri na asatọ, ma nwekwa ebe a na-atụ ndụ mmanụ, na ọtụtụ ime ụlọ ọgbakọ ezumeezu n'ime ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.