Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ 103 Maka Òtù Nzúzo

Jul 29, 2020 - 17:41
Jan 26, 2021 - 17:42
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ 103 Maka Òtù Nzúzo

By Izunna Okafor

Isi ọchịchị ụlọọrụ uweojii na steeti Anambra ekwuola na ụlọọrụ ahụ anwụchiela mmadụ dị otu narị na atọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, maka itinye aka n'òtù nzúzo, ohi na arụrụala ndị ọzọ dị iche iche.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Haruna Mohammed bụ ya mere ka a mara nke a, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, n'Awka banyere nke ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ngalaba ọrụ uweojii ahụ pụrụ iche ná-ébú agha megide otu nzuzo, bụ SPAC, nọrọ n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị a wee nwụchie Maazị Somtochukwu Onyebuchi (gbara ahọ iri abụọ) bụ onye obodo Ogidi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Idemili North, maka ịdọbànyèsị ụmụaka n'òtù nzuzo. Ya bụ nwokorobịa ka e kwuru na o teelarị anya ndị uweojii jiri chọba ya, wee ruo ụbọchị ahụ a nwụchiri ya. 

Site na nnyòcha e mere, a chọpụtara ma nwụchikwa ụfọdụ ndị ọ dọbagoro n'otu nzuzo 'Junior Vikings Secret Cult Confraternity (JVC)', nke gụnyere Okoliechukwu Elozanam (gbara ahọ iri na isii) na Precious Nmamdi Joseph (gbara ahọ iri na ise). Ndị ahụ kwetakwara n'ezie ma jiri ọnụ ha sàá asịsà na ihe ahụ e kwuru bụ eziokwu. A ka na-emekwazị nnyocha n'okwu ha ugbu a, nke, mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, ndị uweojii ahụ nọkwara n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa a, wee nwụchie mmadụ isii bụ ndị otu nzuzo 'Aro Bagger Confraternity' na 'Ayes Confraternity', nke gụnyere Chibuike Nwagozie (gbara ahọ iri abụọ na otu) ma bụrụkwa onye Ụmụdim Nnewi, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Nnewi North.

N'ịga n'ihu n'agha ha a na-ebu megide mpụ na arụrụala, malite n'abalị iri na isii nke ọnwa Julaị a wee ruo taa, ndị uweojii nwụchiri mmadụ mkpokọta ọnụọgụgụ ha dị otu narị na atọ.

Ka ọ dị taa, n'ime mmadụ otu narị na atọ ahụ e jidere, e nyochara ma tọhapụ mmadụ iri atọ n'ime ha, dịka mpụtara nnyocha e mere ha siri kọwaa. Mmadụ iri abụọ n'ime ndị ahụ fọrọ afọ bụkwa ndị a kpụpụgoro ụlọikpe, ebe mmadụ iri abụọ na asatọ ka nọkwa n'okpuru nlekọta ndị uweojii ugbua, maka ahọ ha. Nnyocha ka na-agakwazị n'ihu ugbu a n'okwu banyere mmadụ iri abụọ na ise ndị ọzọ fọrọ afọ.

Ihe dị iche iche e nwekọtara n'aka ndị ahụ a nwụchikọrọ gụnyèrè ụdị égbè dị iche iche, nakwa mgbọ egbe; mmà iri na otu, ihe e ji akpọ anwụrụ ike, anwụrụ ike a gakọrọ n'àkpà, ọkụkọ abụọ dị ndụ, otu ewu e gburu egbu maka iji chụọ àjà, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii ba steeti ahụ, bụ CP John B. Abang kèlère ndị Anambra maka ịkwàdo ọrụ nchekwa na steeti ahụ site n'inye ha ozi dị mkpa ga-enye aka iji memilaa ndị omekóòmè na steeti ahụ. Oge ọ na-ekwe nkwà na ụlọọrụ uweojii agaghị ada mbà n'ịchụ arụrụala ọsọ ụkwụ erughị ala na steeti ahụ, CP Abang gwakwazịrị ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ; ọbụladị ka o jikwara ohere ahụ gwa ha ka na na-akpọtụrụ akara ekwentị 07039194332 iji nye mkpesa maọbụ kpọọ òkù mgbataọsọ oge ọbụla ha hụtara ọnọdụ dị añaa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.