N'Enugu, Oke Dibịa ‘Onyeozi Ekwensu’ Anwụọla, E Jiri Ụgbọala Benz Ọhụrụ Lie Ya n'Abalị

Dec 16, 2021 - 20:24
Dec 17, 2021 - 08:02
 0

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Ótù oke dibịa a mà àmá, n'obodo Aji dị n'okpuru ọchịchị ‘Igbo-Eze North’ nke steeti Enugu, bụ Maazị Simon Odo, onye e jikwa ‘King of Satan’ na ‘Onyeozi Ekwensu’ wee mara anwụọla ka ọ gbachara ahọ iri asaa na anọ.

Maazị Simon Odo bụ onye lụrụ nwaanyị ruru iri ise na iteghete (59) n'ọnụọgụgụ, ma nwekwa ụmụ na ụmụ-ụmụ karịrị narị atọ (300) n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa onye nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ka ọ rịachara obere ọrịa.

Ọ dị ncheta na ya bụ dibịa bụ onye na-ewu èwù n'ọrụ dibịa ya, ma bụrụkwa nwoke kwenyere ma kwenyesie ike n'ọgwụ ya, ihe na-ejere ya ozi na ihe ọ na-ejere ozi. Ọ bụkwa n'Ijabode ka ọ mụrụ ọrụ, oge ndị mmadụ jichara ịgwọ ọgwụ mee ya arụ, site n'ime ya ụkwarantà, nke ọ rịagidere ruo ahọ ise.

Ka ọ rịachara nke ahụ, e mekwara ya enyi ure, mee ya ka ọ dàá ngwọrọ, nke na o rie nri maọbụ ñụọ mmiri, o si n'ụkwụ ya rere ure wee pụta. 

Ọ bụ ihe ndị a mezịrị o jiri kpebie ịga mụọ ọrụ dibịa n'Ijabode, bụzị nke ọ mụrụ ahọ asaa zuru èzù, ma kpebia na ọ gaghị eji ya na-egbu maọbụ megide mmadụ, kama ọ bụ naanị ịzọpụta ndị nọ na mkpà na ndị e ji eji.

E mere ya mmirichukwu n'ahọ 1956, ọ nata oririnsọ n'ahọ 1958, ma jee ozi n'ụlọụka dịka 'mass server' malite n'ahọ 1959 ruo n'ahọ 1960, tupu ‘o wee bido ifè Ekwensu’.

Ya bụ nwoke dọkwàrà ụmụ ya aka na ntị mgbe ọ dị ndụ ka ha ghara itinye ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu ma ọ nwụọ, bụzị nke mere ha jiri lie ya n'ebujeghị ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu oge ọ nwụrụ.

N'okwu ya banyere ọnwụ nna ya, otu n'ime ụbara ụmụ Odo, bụ Emeka kọwara nna ya dịka ezigbo mmadụ kwụbara aka ya ọtọ mgbe ọ dị ndụ, ma kwuo na nna ya nyere ha ntụziaka ka e lie ozu ya ngwangwa ọ nwụrụ.

O mekwara ka a mara na ọ rịarà ọrịa ihe dị ka izuụka atọ tupu ọ nwụọ, ha wee kpebie ili ya ozigbo dịka o siri nye ntụziaka.

Ha jikwazịrị kpọchakpọcha ụgbọala Benz ọhụrụ na-egbuke egbuke wee lie ya bụ oke dibịa:

Lee vidio dị na mgbago ka ị hụ etu o siri gaa:

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484