Obianọ Ekelee Chineke Maka Ndụ Kọmishọna Ezenwanne, Tòó Ndị Ọrụ Nchekwa

Apr 8, 2021 - 09:49
 0
Obianọ Ekelee Chineke Maka Ndụ Kọmishọna Ezenwanne, Tòó Ndị Ọrụ Nchekwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekeleela Chineke maka nzọpụta ahụ ọ zọpụtara otu Komishọna ya n'aka ndị omekoome, bụ ndị tọọrọ ya ma hapụkwa ya ka ọ gachara mkpụrụ ụbọchị olenaole, n'enweghị ihe ọbụla ha mere ya.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a na mmemme ịka ụka pụrụ iche e jiri merùbe ụbọchị Ista nke ahọ 2021, bụ nke weere ọnọdụ n'obodo ya dị n'Agụleri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', ma bụrụkwa nke ụmụ ya abụọ nọkwara na ya wee nata oririnsọ nke mbụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara ntọhapụ ahụ a tọpụrụ ya bụ Kọmishọna dịka onyinye kachasị onyinye Chineke nyere Ndị Anambra n'Ista nke ahọ a, ma kelekwazie Chineke onye mere ka ndị ahụ tọhapụ ya bụ nwa amadi n'ahụ zuru òkè, n'emeghị ya ihe ọbụla.

Ọ dị ncheta na ndị omekoome a maghị ndị ha bụ nọrọ ụbọchị Wenezdee izuụka gara aga wee tụọ ka égbé n'ebe otu onye n'ime ndị ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' were apụta ịzọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ n'ahọ a, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo na ụfọdụ ndị ntorobịa nọ were na-enwe nzukọ n'obodo ya bụ Isuọfịa dị n'okpuru ọchịchị Agụata, wee gbagbuo ndị uweojii atọ, bukọrọ égbè ha, ma tọrọkwa Kọmishọna na-ahụ maka ihe ndị e ji enyere ndụ aka na steeti ahụ, bụ Maazị Emeka Ezenwanne.

Ka nke ahụ gachara, o nweghịzịkwa onye ma ebe ndị ahụ tinyere isi, ma ya fọdụzịkwaa ịma ebe ha bugara Kọmishọna ahụ.

Nke a mezịrị ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche nọ na steeti ahụ jizịrị wee malite ime nnyocha na ịgbasi mbọ ike iji zọpụta ya bụ Kọmishọna n'aka ndị tọọrọ ya.

Ka o sila dị, ya bụ Kọmishọna nọrọ n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị ụka bụ ụbọchị Ista wee batara onwe ya, dịka ndị ahụ tọọrọ ya hapụrụ ya ka ọ laa, n'etighị ya ihe, gbuo ya maọbụkwanụ merụọ ya ahụ n'ụdị ọbụla.

Gọvanọ Obianọ kelekwazịrị ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ maka ezi agbambọ ha, ma kwe nkwa na ọchịchị ya agaghị ada mba inye Ndị Anambra ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, n'agbanyeghị ihe iche aka mgba dị iche iche na-ebi ọnọdụ nchekwa aka ọjọọ na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ugbua.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484