Gọọmenti Anambra Agbachiela Ebe Ahụ Ụlọ Dara n'Oba

Apr 10, 2022 - 22:58
 0
Gọọmenti Anambra Agbachiela Ebe Ahụ Ụlọ Dara n'Oba

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ; maka na na agadi nwaanyị kachie nrị wụọ aja, e bute ozu ya n'ófè nke ọzọ.

Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra agbachiela ebe ahụ ụlọ obibi dị òkpùkpù ise a na-arụ arụ dara n'Oba, n'okpuruọchịchị ‘Idemili South’ nke steeti Anambra, dịka o siri dị na mkpebi ahụ o mere ịgbachi na iwèghàrà ebe ọbụla ụlọ dara na steeti ahụ.

Mgbachi ogige ahụ e mere n'ụlọ ahụ dị na mpaghara ‘A-Class Avenue Saint John Paul Estate, n'ógbè Umuogali, Oba bụ nke e mere site n'aka òtù ọrụ pụrụ iche, nke ọ bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board (ASPPB) nọ n'isi ya.

Ndị ọrụ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ mberede, bụ ụlọọrụ Nationala Emergency Management Agency (NEMA) na nke steeti ahụ, bụ SEMA sokwara wee gaa ọrụ ịgbachi ogige ahụ.

N'okwu ya banyere ụlọ ahụ oge ya ndị òtù ọrụ ya gara ịgbachi ya, onyeisioche ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Chike Maduekwe mere ka a mara na o nweghị nkwàdo maọbụ ikike ọbụla ndị na-arụ ụlọ ahụ nwetara tupu ha malite rụba ya. Ọ kọwakwara na ndị ọrụ ya enwetela ụdị mkparị dị icheiche site n'aka ndị bi na mpaghara ahụ oge ọbụla ha gara ịdọ ha aka na ntị banyere ọrụ ha na-arụ n'enweteghị nkwàdo.

O kwuru na ọ bụ asị ọcha, bụ ozi ahụ ụfọdụ ụlọ mgbasaozi na-ebugharị banyere ụlọ ọdịda ahụ, ma kọwaa na o nweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụkwanụ onye ụlọ ahụ tigidere.

Dịka o siri kọwaa, onye ọbụla chọrọ ịrụ ụlọ kwesiri ibu ụzọ nweta nkwàdó tupu ọ malite rụba ya, ka o wee ghara ịkwa ‘Ngara m mara’ ma e mechaa, maọbụkwanụ tinye ụmụ mmadụ n'ihe égwù na ihe izè ndụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị ogbe Umuogali, ebe ahụ ụlọ dara, bụ Dọkịta Kingsley Obasoanya kọwara ya bụ ụlọ ọdịda dịka nnukwu ihe mwute, bụkwa nke onye nwe ya bi na mba Spain. O kwukwara na onye ji ya bụ ọrụ ngo bụ onye ndị obodo ahụ na-achọgharị kemgbe, mana o nweghị onye ma ebe o tinyere isi.

Dịka ọ na-ekwupụta na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mba n'ịrụ ọrụ ha etu o kwesiri ekwesi; Maazị Mmaduekwe gakwara n'ihu kwupụta ezi njikere ụlọọrụ ahụ dị ịrụkọ ọrụ ọnụ, ya na gọọmenti steeti ahụ, iji kwàlite usoro ezi ọnọdụ kwesiri ekwesi na n'ihe gbasaara iwu ụlọ na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484