Ọkụ Ọgbụgba Ebibiela Ọtụtụ Ngwaahịa n'Ọchanja

Mar 11, 2021 - 14:21
 0
Ọkụ Ọgbụgba Ebibiela Ọtụtụ Ngwaahịa n'Ọchanja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkụ ọgbụgba dapụtara na mpaghara ụzọ Amobi dị n'ime ahịa Ọchanja, n'Ọnịtsha dị na steeti Anambra emeela ọtụtụ ndị mmadụ 'echete ebebe' na nsonso a, ma tinye ọtụtụ ndị ọzọ n'ajọ ọnọdụ ihe isi ike n'otu ntabi anya.

N'okwu ha banyere ya bụ ọkụ ọgbụgba, ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kwùrù na ọkụ ahụ malitere ịgba oge ọ fọdụrụ nkeji iri ka ọ kụọ elekere abụọ nke ọnụ ụtụtụ, ma sịkwa na ọ bụ ọkụ latiriiki mere ọkụ ọgbụgba ahụ jiri màlite, n'ihi na ọ bụ oge e wetere ọkụ ka ya bụ ọkụ ahụ màlitere.

N'okwu nke ya, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ; onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CSP Haruna Mohammed gbàrà akaebe nà ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtàrà n'ezie, ma mee ka a mara na onyendu ndị uweojii na-elekọta mpaghara ahụ, bụ SP Ifeanyi Iburu kpọọrọ ndị ọrụ ya wee wụchaa n'ebe ahụ ozigbo ha nwetara ozi banyere nke ahọ; ha wee chekwaa ebe ahụ, iji gbochie izu ohi ngwaahịa n'ebe ahụ maọbụ ụdị ihe ọdachi ọzọ ịdapụta.

O mere ka a mara na a kpọtụụrụ ndị ọrụ nsọnyụọkụ mgbe ihe ahụ mere, ha wee wụchaa n'ebe ahụ ozigbo, ma nye aka wee gbanyụọ ya bụ ọkụ, nke mezịrị ka ọ ghara inwusà bàá n'ebe ndị ọzọ maọbụ bibikwuo ọtụtụ ihe.

Na ntụnye nke ya, onye duru ndị òtù ọrụ nsọnyụ ọkụ wee bịa ọrụ ahụ, bụ DSP Kerian Uzoma, kọwara na otu ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ na ndị uweojii siri wee gbata ọsọ ahụ n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee ozigbo ozigbo a kpọtụụrụ ha.

Ha mezịrị ka a mara na nnyocha ka na-aga n'ihu, iji chọpụta ihe ọ bụ ya kpata ajọ ọkụ ọgbugba ahụ n'eziokwu, ya na usoro mgbochi, maka ụdị ajọ ọdachi ahụ ịdapụta ọzọ n'ọdịnihu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484