A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Na-Edobe Ọwà Mmiri Ha Ọcha

Sep 24, 2020 - 21:54
Jan 24, 2021 - 21:57
 0
A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Na-Edobe Ọwà Mmiri Ha Ọcha

Si n'aka Izunna Okafor

Ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, ma na-akakwa mma iji ehihie wee chụba ewu ojii, maka na chi jie ọ hịa ahụ njide.

Ọ bụ n'ịgbaso nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri kpọọ òkù ọzọ ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha na-edebe ọwà mmiri ha ọcha, ma kwụsị iji unyi, atịtị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ were na-emetọ maọbụ na-asụchisi ọwà ọwà mmiri dị na mpaghara ha.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Clear Drainage and Forest Preservation Agency,' bụ Maazị Chido Obidiegwu n'okwu ya oge ya na ndị òtù ọrụ ya na-abàgide n'ọrụ ịkọchàsị ọwà mmiri suchisiri àsụchi na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na steeti ahụ. O kwuru na ebumnobi nke ahụ bụ iji hụ na mmiri na-ehùrú onwe ya ma na-agakwa etu o kwesiri.

Dịka ọ na-akatọ etu ndị mmadụ si ekponye ahịhịa n'ebe mmiri si aga, Maazị Obidiegwu gbarụkwàrà ihu bànyere etu ụfọdụ ndị oji ego achụ ego nà ụfọdụ ụlọọrụ dị iche iche na steeti ahụ si emetọsị ọnọdụ gburugburu site n'iji ụnyí na ihe ọjọọ ndị ọzọ si n'ụlọọrụ ha apọta wee na-asụchisi ọwà mmiri ma na-emekwa ka ebe niile na-esì ísì. 

Ọ sị na nke ahụ bụ nnọọ nnukwu ihe iche aka mgba nye ọnọdụ ahụike ndị na-ekùrú ihe ahụ n'imi nakwa ndị niile bi na gburugburu ahụ. O kwuzịrị na gọọmenti steeti ahụ agaghị egbu oge ịkpụpụ onye maọbụ ụlọọrụ ọbụla mere ihe dị etu ahụ ọzọ ụlọikpe, malitezie ugbua dịrị gaba, ebe a ga-anọ jiri usoro iwu wee gwa ya ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Ebe dị iche iche Maazị Obidiegwu na ndị òtù ọrụ ya bàgidere n'ọrụ nà njem nleta ọrụ ahụ gụnyèrè ụzọ Atanị dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru; ụzọ Ọrlụ dị n'okpuru ọchịchị n'okpuru ọchịchị Ihiala, nakwa okporo ụzọ Nneni—Adazi-Ani dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onyeisioche nchere ogè n'okpuru ọchịchị Ọgbaru, bụ Maazị Arinzechukwu Awogu kèlèrè gọọmenti steeti Anambra maka etu o si agbasi mbọ ike ịkọchàsị na ịhụ na ọwà mmiri na-adị ọcha, iji kwàlite ezi ọnọdụ adịmọcha gburugburu steeti ahụ.

O kelekwara gọọmenti ọkachasị etu o siri buru ya bụ ọrụ wee bịa na mpaghara okpuru ọchịchị ahụ, maka na ha bì n'akụkụ mmiri, ma bụrụkwa mpaghara ebe iju mmiri na-enyekarịkwa nsògbu na mgbè na mgbè. O kwere nkwà na ndị okpuru ọchịchị ahụ kwụ gọọmenti na-azụ, ma kwuo na ha agaghị agharịpụ maọbụ dàá mbà ịga n'ihu na-akwàlite atụmatụ adịmọcha ahụ.

Ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ dị iche iche a gara ụbọchị ahụ kèlèrè ọchịchị steeti Anambra maka ezi ọrụ ya, ma kwe nkwà na ha ga-amalitezị ebe gọọmenti kwụsịrị, iji hụ na ọwa mmiri dị na mpaghara ha na-adị ọcha oge ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.