COVID-19: Ụlọọrụ China ejirila ihe erimeri kwàdo gọọmenti Anambra

May 20, 2020 - 20:25
Jan 22, 2021 - 20:52
 0
COVID-19: Ụlọọrụ China ejirila ihe erimeri kwàdo gọọmenti Anambra

Izunna Okafor, Awka

Nnekwu ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ, ebe ndị Igbo sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ. Ka ọ dị taa, n'iji sị ya jisie ike, otù ụlọọrụ ngo mba China ejirila ihe erimeri dị iche iche wee kwàdo gọọmenti steeti Anambra n'agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona nà mmetụta ya dị iche iche n'ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.

Mmemme inyefè ihe oriri ahụ n'aka gọọmenti bụ nke weere ọnọdụ na nso nso a n'obí gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị so n'òtù ọrụ gbanụ gbanụ ahụ gọọmenti steeti ahụ guzobere maka ọrịa ahụ sonyèrè na ya.

Oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n'aka gọọmenti, onye na-ahụ maka mmekọrịta ụlọọrụ ahụ na ọhaneze, bụ Maazị Abdulfata Abdulraheem kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka mbọ dị iche iche ọ gbagòrò nà ihe o mepụtagoro n'agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa ahụ nà mmetụta nke oge ihe isi ike a n'ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.

O mere ka a mara na ọ bụ ihe ndị ahụ mèrè ha jiri kpebie ịbịa kwàdo ọchịchị steeti ahụ, iji ịsị ya jide ka o ji n'agha ahụ ọ na-ebu; ma gosipụtakwazie olileanya o nwere na ọrịa ahụ ga-emechaa bụrụ ihe akụkọ.

Na nzaghachi oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ n'aha gọọmenti Anambra, ode akwụkwọ gọọmenti steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kèlèrè ụlọọrụ ngo ahụ maka ịza ọkpụkpọ òkù gọọmenti kpọrọ maka nkwàdo ọhaneze n'agha ahụ ọ na-ebu megide korona. O kelekwara ụlọọrụ ahụ maka etu o si ememìla ma na-ebuso mbize agha na steeti ahụ, ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n'ọrụ dị iche iche ha na-abagide.

O jikwazị ohère ahụ wee kelekwa ndị dị iche iche nyegoro gọọmenti steeti ahụ nkwado n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche iji sị ya jisie ike n'imemìlà ọrịa ọjọọ ahụ, me kwenwòó nkwà na a ga-aga n'ihu ịdị na-etinye ihe ndị ahụ niile n'ọrụ nke ọma dịka o siri kwesi.

Ihe erimeri dị iche iche ụlọọrụ ahụ bùnyere gọọmenti ụbọchị ahụ gụnyèrè akpa osikapa dị otu narị na iri atọ, tínyéré igbe erimeri noduul ruru narị abụọ n'ọnụọgụgụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.