Anambra 2021: Mụ Onwe M Ka So Azọ, PDP Eweputebèghị Mmadụ —Maduka

Jul 4, 2021 - 15:52
 0
Anambra 2021:  Mụ Onwe M Ka So Azọ, PDP Eweputebèghị Mmadụ —Maduka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ezi nwa afọ steeti Anambra ahụ na-ewu èwù na mba ụwa ma bụrụkwa ọkaibe n'ihe gbasaara ahụike, bụ Dọkịta Godwin Maduka emeela ka ụwa mara na ya ka so azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, bụ nke a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a bụ 2021.

Dọkịta Madụka kwupụtàrà nke a na nnukwu mmemme ọ chịkọbara na nsonso a n'Ọka bụ isi obodo steeti Anambra, bụ mmemme oriri na ọñụñụ o jiri sị ndị na-akwàdo ya 'Daalụ' maka nkwụdosiike ha nà nkwàdó pụrụ iche ha nyègoro ya na njem ahụ ọ na-abagide ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, bụkwa nke ọ na-azọ n'okpuru òtù ndọrọndọrọ ọchịchị 'People's Democratic Party (PDP)'.

Ya bụ nwoke ọrụ obi ebere kwupụtara na obi adịghị ya mma banyere etu ndịisi otu ndọrọndọrọ PDP siri meso ya na nhọpụta ime ụlọ ahụ ha mere na nsonso a, bụ nke ọ bụ naanị vootu ise ka o nwetere na ya; ọbụladị dịka ọ kọwara ya bụ nhọpụta ime ụlọ dịka nke aghụghọ na mago-mago jupụtara n'ime ya.

Dịka o siri kwuo, ọ ka bụkwa onye òtù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP, n'agbànyèghị ihe ahụ ndịisi ọchịchị  mere òtù ahụ mere ya . O kwukwàrà na ọ gaara ahapụ òtù ndọrọndọrọ ahụ, bàá n'otu ndọrọndọrọ ọzọ; mana ọ sị na ebe ọ bụ na PDP enwebeghị onye a hụbara ama ha wepụtara ga-eji aha òtù ndọrọndọrọ ahụ wee zọọ ọkwa, na ya na ka nọkwa n'òtù ahụ.

Dịka ọ na-ekwupụta ọzọ n'ebe o doro anya na o nwebèghị onye ọbụla a mà kpọnkwem òtù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP weputere maka ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ, Dọkịta Madụka, onye nwere nzere ọkammụta atọ n'ihe gbasaara ahụike, gàkwàrà n'ihu mee ka mara na ọtụtụ Ndị Anambra chọrọ ka ọ bụrụ gọvanọ steeti ahụ; ọbụladị dịka o kwupụtara ezi olileanya o nwere na ọ ga-enwetarịrị nturuugo na nhọpụta ọkwa Gọvanọ ahụ a ga-eme n'ọnwa anọ na-abịa abịa.

Banyere ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o mechaa turu ùgò dịka Gọvanọ steeti ahụ, Dọkịta Maduka kwuru na ebumnobi o ji azọ ọkwa gọvanọ bụ ka o jeere steeti ya na Ndị Anambra ozi, n'ihi na o meela ọtụtụ ihe na-ewu ewu na ihe dara ụda na mba ụwa, nweta nzere na agụmakwụkwọ dị iche iche, ma nwekwa ezi ọgụgụisi, amamihe na ahụmahụ dịka ezi onye ndu, bụzị nke mere ya ka ọ bụrụ onye kacha tozuo òkè n'ime ndị niile ahụ so ya azọ ọkwa gọvanọ ahụ.

O kwuru na o nweta nturuugo, na ọ ga-enwògharị ngalaba ahụike nglaba mmụta na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ; kwalite njem ala, njem ikuku na njem mmiri; kwàdo ma kwàlite ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị etu o kwesiri; ma kwàlitekwazie ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ na ọnụego a na-enweta n'ime steeti ahụ.

Ya bụ nwa amadi nwe ụlọọrụ 'Las Vegas Pain Institute and Medical Cente' dị na mba USA gàrà n'ihu kwe nkwà na ọ ga-ekpochasị gburgburu Ohimiri Naịja ma mee ka ézì ọhịa kwụsị ịkpagharị n'ebe ahụ, waghee ya bụ Ohimiri Naịja wee ruo 'Atlantic Ocean', iji mee ka e jiri ụgbọ mmiri na-ebulata ngwaahịa n'ebe ahụ. O mekwazịrị ka a mara na o nweghị ezinụlọ ọbụla n'Anambra ga-ebi n'ụlọ akịrịka ma ọ bụrụ gọvanọ steeti ahụ n'ihi na ọ ga-arụgharị ụlọ ọbụla dị etu ahụ, tinyere ọtụtụ nkwà ndị ọzọ o kwere. 

Dịka ọ na-agwa ọhaneze na-akwàdó ya ka ha kwụdosiere ya ike, Dọkịta Madụka kpọkukwàzịrị isi ọchịchị otu ndọrọndọrọ PDP ka ha mee ihe ziri ezi na ihe kwesiri ekwesi ma mekwa ya ngwangwa, dịka o siri metụta usoro na mkpebi iwepụta onye ga-eji aha otu ahụ wee zọọ ọkwa gọvanọ, maka na ọ ga-aghọ ha ahịa n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe ziri ezi na ihe kwesiri ekwesi ma mekwa ya ngwangwa, dịka ya bụ nhọpụta ọchịchị na-akpụdobe nso n'ike n'ike ugbua.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484