Soludo Ga-Ebido Ebe M Kwụsịrị —Obianọ

Oct 31, 2021 - 22:18
 0
Soludo Ga-Ebido Ebe M Kwụsịrị —Obianọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Dịka nhọpụta ọkwa Gọvanọ ahụ a ga-eme n'ime steeti Anambra na-akpụdobe nso, aka na-achị steeti ugbua, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' were azọ ọkwa ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ga-amalite ọrụ mmepe na ọchịchị steeti ahụ n'ebe ya onwe ya kwụsịrị tupu oge ọchịchị ya wee bịa na njedobe.

Gọvanọ Willie Obianọ kwupụtara nke a oge ndị otu ndọrọndọrọ ahụ na-abàgide na mmemme achụmta nkwàdo n'ime okpuruọchịchị ime obodo dị icheiche na steeti ahụ, nke gụnyere okpurọchịchị Njikọka, Anaọcha, Awka North na Awka South.

Mmemme achụmta nkwàdo ahụ bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ nọ́gásị́ n'okpuruọchịchị ndị ahụ nupụtàrà n'ìgwè wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke dọtagasịrị ọtụtụ ndị selitere isi nà ndị e ji okwu ha agba ìzù n'otu ndọrọndọrọ APGA.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ dụrụ ndị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha hụta ya dịka ihe dị óké mkpà ịpụtà n'ìgwè wee soro tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ a ga-atụ akwụkwọ, bụ abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, karịa ịnọ n'ụlọ ụbọchị ahụ.

Ọ rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe dị icheiche ọchịchị ya meputegoro n'ime ahọ asaa gara aga, ma kwe nkwà imezupute nkwà dị icheiche ya onwe ya kwere mgbe ọ na-achụ nta nkwàdo ọchịchị, tupu o nyefee ọkwa n'aka Gọvanọ na-abịa abịa, iji malite ebe ya onwe ya kwụsịrị.

Gọvanọ Obianọ kwupụtazịkwara nkwenyesiike ya na ọ bụ Ọkammụta Soludo bụ onye kacha tozuo òkè iwèghàrà ọchịchị n'aka ya n'ime ndị niile na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ahọ a. O kwukwara na o nwere ezi olileanya na Soludo ga-ebido ebe ya onwe ya rụdobere, ma mekwa nke ọma karịa ka a tụrụ anya ma ọ banye n'ọkwa dịka Gọvanọ steeti ahụ. Ọ sị na ọ ga-adọta ọtụtụ mmepe na ngalaba dị icheiche n'ihi na ọ mà mmadụ nke ọma, bụrụ onye ma nke ekwe na-akụ n'ịhazi ọnọdụ akụnụba, ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa dị icheiche, ma n'ala Nigeria na n'ogoogo mba ofesi, bụkwa ebe o mere nke ọma.

N'okwu nke ya, Ọkammụta Soludo gbara akebe na ezi àmà banyere ihe dị icheiche Gọvanọ Obianọ kwuru maka ya, ma kwe Ndị Anambra nkwà na ọ gaghị agharịpụ ha ma ha kwàdo ya.

Ọ kpọpụtasịkwara ụfọdụ ọkpụrụkpụ ihe dị icheiche ọ ga-eme n'ọchịchị ya, ma rịọkwazie ụmụafọ okpuruọchịchị ahụ na ndị Anambra n'izugbe ka ha pụta n'ìgwè n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba a ma tụnyere ya na osote ya bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA were azọ ya bụ ọkwa, ka APGA wee gaa n'ihu n'ọrụ ọma o ji n'aka na steeti ahụ. 

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere Onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA n'ala Nigeria, bụ Maazị Victor Oye; Sinetọ Victor Umeh nọchibụrụ anya mpaghara ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra Central' n'ụlọ ọgbakọ sineetị; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Signage and Advertisement Agency, ANSAA, bụ Maazị Jude Emecheta; onyeisioche nchereoge n'okpuruọchịchị Anaọcha bụ Maazị Patrick Onyedum; nke Njikọka, bụ Maazị George Obiozoh; nke Awka South, bụ Maazị Leo Nwuba; nke Awka North, bụ Maazị Ferdinand Onwuje, tinyere ọtụtụ ndị omeiwu n'ogoogo steeti na n'ogoogo gọọmenti etiti, ndị isi ụlọọrụ gọọmenti na ndị ọzọ dị icheiche ọnụ na-eru n'okwu.

A nọkwara na mmemme ahụ mee ihe ngosi, nke gụnyere iti mmọnwụ; gụọrọ Ọkammụta Soludo na onye òtù ya egwu nkwàdo site n'aka ndị òtù dị icheiche, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ mere ka mmemme ahụ kwòó èkwòó.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484