N'Anambra, Ohaneze Ndị Igbo Ahọpụtala Ndị Ndu Ọhụụ

N'Anambra, Ohaneze Ndị Igbo Ahọpụtala Ndị Ndu Ọhụụ

Jan 13, 2021 - 23:48
Jan 18, 2021 - 23:48
 0
N'Anambra, Ohaneze Ndị Igbo Ahọpụtala Ndị Ndu Ọhụụ

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ dị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ. N'ịgbaso nke a, ndị òtù Ọhaneze Ndị Igbo, ngalaba ya nke steeti Anambra nọrọ nsonso a wee họpụta ndị ndu ọhụụ ga-anọ n'isi òtù ahụ n'ime steeti ahụ, dịka ogè ọkwa ọchịchị ndị nọbụ n'isi ọchịchị òtù ahụ bịàrà n'isi njedobe.

Ya bụ mmemme ntụliaka é mere n'ụzọ udo bụ nke a nọrọ na ya wee họpụtakwa ndị ndu òtù ahụ n'okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na steeti ahụ, bụkwa ndị e guzobere ma dukwa n'iyi ọrụ ngwangwa e mechara ya bụ ntụliaka.

Na nhọpụta nke e mere n'ogoogo steeti, Maazị Festus Emeka Udodeme bụ onye nwetara mmeri dịka onyeisioche ọhụụ òtù ahụ n'ime steeti Anambra, na ya bụ ntụliaka wééré ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ndị ọzọ a họpụtakwara iji ọkwa dị iche iche n'otu ahụ n'ogoogo steeti ahụ gụnyèrè Maazị Titus Akpudo (osote onyeisi); Maazị Chukwudubem Okafor (odeakwụkwọ); Maazị Godwin-Iwuchukwu (odebe ego); Maazị Fredrick Nwafor (odekọ ego); tinyeré Maazị Samuel Udogalanya (osote odeakwụkwọ).

Ndị ọzọ gụnyèrè Maazị Gilbert Olumba (odeakwụkwọ mgbasaozi); Maazị Peter Ezeofor (odeakwụkwọ nhazi); Maazị Emmanuel Emelife (osote odebe ego) Maazị Samuel Nweke (osote odeakwụkwọ mgbasaozi); Maazị Innocent Nwabuike (osote odekọ ego); na Maazị Moses Odianma (osote odeakwụkwọ nhazi).

N'okwu nnabata ya, ya bụ nwa amadi a họpụtara ọhụụ dịka onyeisioche òtù ahụ n'Anambra, bụ Maazị Udodeme kèlèrè ndị òtù ahụ maka ịkwàdo ya ịbanye n'ọkwa ahụ dị elu nakwa inye ya ohere ọma ahụ iji jere steeti ahụ, Ndị Igbo nakwa ala Nigeria ozi. 

O kwere nkwà na ọchịchị ya ga-arụ isi ụlọọrụ bụ ịgbà maka òtù Ọhaneze Ndị Igbo n'ime steeti Anambra, ma kọwapụtakwa mkpà ọ dị na e mèrè ka ya bụ òtù guzosie ike n'ime obodo na okpuru ọchịchị niile dị iche iche na steeti ahụ.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na ọ ga-eji ọkwa ọchịchị ahụ wee kwalite mmezupụta ọchịchịobi Ndị Igbo oge niile, Maazị Udodeme rịọkwazịrị nkwàdo na ekpere ndị Igbo nakwa inye aka Chineke, iji nwee ike ịrụ ọrụ ya nke ọma, ma rụkwa ya n'ụzọ ọ ga-enye Chineke otutu ma tọkwa ndị Igbo obi ụtọ.

Na mbụ n'okwu ya, onye jibụ ọkwa dịka onyeisioche Ọhaneze Ndị Igbo na steeti Anambra ma bụrụkwa onye nke rịturu n'ọkwa ugbua, bụ Maazị Damian Okeke-Ogene kèlere Gọvanọ Willie Obianọ, ụmụafọ steeti Anambra nakwa ndị Igbo n'izugbe maka nkwàdo ha nyere ọchịchị ya na òtù ahụ oge ọ nọ n'ọkwa ọchịchị, ya na ezi mmekọrịta dị n'etiti ha na òtù ahụ.

Ọ rịọkwara ha otu ihe ahụ n'isi ọchịchị ahụ batara ọhụụ ugbua, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị ndu ọhụụ ahụ ọdụ ka ha na-akwàdo ma jigidesiekwa omenala Igbo ike, ma kwàlitekwa ùgwù dịịrị òtù ahụ site n'ịchụsò na imezùpụta ebumnobi òtù ahụ n'ozuzuokè n'ime steeti ahụ.

Ya bụ ntụliaka e mere n'ịgbasò ntụziaka ahụ gọọmenti nyere maka ọrịa nje korona, dọtàrà ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, bụ ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria na mpụga ya wee bịa sonye na ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.