Ịgba Òrìngò: Ndị Uweojii Lagos Ejidela Mmadụ 237 Maka Ịda Iwu Korona

Jan 13, 2021 - 23:52
Jan 21, 2021 - 18:19
 0
Ịgba Òrìngò: Ndị Uweojii Lagos Ejidela Mmadụ 237 Maka Ịda Iwu Korona

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ; ma sịkwa na ọ na-abụ agadi nwaanyị kachie ntị wụọ aja, e bute ozu ya n'ofète nke ọzọ.

Ka ọ dị taa, ndị uweojii steeti Lagos anwụchiela ma kpụgharịa mmadụ dị narị abụọ, iri atọ na asaa (237) maka inupu isi n'iwu na ntụziaka ahụ gọọmenti nyere banyere ọrịa nje korona.

Ndị ahụ e jidere ka e kwuru na ha bụ ndị gara gbaa oringo n'ụfọdụ ụlọ nkwariakụ dị na mpaghara Surulere na Victoria Island dị na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n'isi nwụcha izu ụka gara aga, ebe ha nọ agbara oringo ma na-ekporikwa ndụ.

N'okwu ya oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Hakeem Odumosu kwuru na mnwuchi ahụ a nwụchiri ndị ahụ bụ nke dabara adaba n'ilekwasị anya n'ọrụ dịịrị ha bụ ndị uweojii ịhụ na ndị mmadụ na-erube isi nye iwu na ntụziaka gọọmenti n'ozuzuoke, ọkachasị dịka o siri metụta iwu na ntụziaka ahụ gọọmenti nyere banyere ọrịa nje korona. 

O mere ka a mara na ụlọọrụ ya na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'itinye amụma iwu na ntụziaka gọọmenti n'ọrụ nakwa ịgba mbọ hụ na ndị mmadụ rubere isi n'ozuzuoke nye ntuziaka ahụ gọọmenti nyere dịka ụzọ kacha mma isi gbochie mgbasà ajọ ọrịa ahụ.

Ọ kọwara na mmadụ 237 ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ n'ụlọ nkwariakụ dị iche iche na steeti ahụ maka eyighị uwe mkpuchi imi na ịda iwu ndị ọzọ gọọmenti nyere maka korona, ebe mmadụ isii ọzọ bụ ndị a nwụchikọrọ maka ịda iwu ahụ gọọmenti steeti ahụ nyere ka onye ọbụla chịkpuo ụkwụ n'ụlọ ya ma gharakwa ịpụta iro n'agbata elekere iri na abụọ nke ime abalị wee ruo n'elekere anọ nke ọnụ ụtụtụ na steeti ahụ, nke mezịrị ka mkpokọta ọnụọgụgụ ndị a kpụgharịrị ụbọchị ahụ dịzie narị anụọ na iri anọ na atọ (243).

Ọ kpọkuru ma dụọ ụmụafọ steeti Lagos nakwa ndị ọzọ bi n'ime steeti ahụ ka ha kpachapụ anya ịhụ na ha na-agbasò ma na-erube isi nye ntụziaka gọọmenti nyere banyere ọrịa nje korona, nakwa amụma iwu ndị ọzọ gọọmenti nyere, ọbụladị dịka o hooro ntùtù taa, sị na ụlọọrụ ya na ndị ọrụ ya agaghị ada mba n'ọrụ ịnwụchikọ onye ọbụla nupuru isi n'ihe ndị ahụ.

O mekwazịrị ka a mara na a ga-akpụpụ ndị oringo ahụ e jidere ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee nye ha ọnọdụ ruuru ha, dịka ihe ha mere siri dị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.