Ụmụnwaanyị Anambra Enyela Oriakụ Obiano Onyinye Nkwanyeùgwù

Feb 10, 2022 - 22:25
 0
Ụmụnwaanyị Anambra Enyela Oriakụ Obiano Onyinye Nkwanyeùgwù

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na okpueze na-adị mma n'isi onye o ruru.

Nịgbasò nke a, òtù ụmụnwaanyị Anambra a maara dịka ‘Anambra Women of Peace and Growth Initiative’ ènyéla nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano onyinye nkwanyeùgwù pụrụ iche

Ndị òtù ahụ bụ ndị jupụtàrà n'ime okpuru ọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti Anambra, ma bụrụkwa ndị nyere nwunye Gọvanọ onyinye nkwanyeùgwù ahụ n'isi ụlọọrụ ya dị n'obi gọọmenti, n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu ya oge ọ na-enye ya onyinye nkwanyeùgwù ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Oriakụ Ngozi Orjiakor kọwàrà na nke ahụ bụ nke kwesiri ekwesi n'ihi ọtụtụ ọrụ ọma dị icheich ya bụ agụ nwaanyị rụrụ, ọkachasị site n'okpuru atụmatụ ọrụ obiebere ya bụ 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)’, site n'ịkwalite ọnọdụ obibindụ ụmụnwaanyị, ụmụaka na ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, tinyere ọtụtụ ihe ọma ndị ọzọ ọ na-emegasị.

O mere ka a mara na ha gbasòrò ntụziaka Oriakụ Obianọ nyere ha wee kwàdó ma tụnyere otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ na nhọpụta ọchịchị ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ahọ gara aga, n'ihi ntụkwasịobi ha nwere n'ebe ọ nọ, maka ihe dị icheiche o megoro.

Ha jakwazịrị ya ike ka o jisie ike n'ezi ọrụ ya, ma kpekwa ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi, ịkwụghàchi na ịgbà ya ume mmaji kwuru mmaji iji gaa n'ihu n'ọrụ ọma dị icheiche o ji n'aka.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anabata onyinye nkwanyeùgwù ahụ, Oriakụ Obianọ, nke nọchitere anya ya bụ onye ji ọkwa 'Program Manager’ n'òtù CAFE, ma bụrụkwa osote odeakwụkwọ mgbasaozi nye Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Emeka Ozumba kèlèrè ndị ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozuru òkè inweta onyinye nkwanyeùgwù ahụ dị oke elu.

Ọ kọwara nkwanyeugwu ahụ dịka nnukwu ihe agbamume, ma kwe nkwà na ọ ga-aga n'ihu na-arụ ezi ọrụ obiebere ahụ e jiri mara ya, ọbụladị ma oge di ya chịchààrà rịtuo n'ọkwa dịka Gọvanọ steeti ahụ. O kwupụtakwara olileanya o nwere na nwunye onye ahụ a họpụtara ọhụrụ dịka gọvanọ steeti ahụ, bụ Oriakụ Nonye Soludo ga-emekwa nke ọma karịa ka ya onwe ya mere; ma rịọkwazie ha ka ha nye ya nkwàdo kwesiri ekwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484