Dayọsiisi Awka Echenwòóla Ndị Nne n'Ihu Chineke, Doo Ha Nsọ

Feb 11, 2022 - 23:10
 0
Dayọsiisi Awka Echenwòóla Ndị Nne n'Ihu Chineke, Doo Ha Nsọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

O kwòrò ekwò ma hịọ ahịọ n'ụlọụka 'Chapel of Redemption' dị n'ime Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka mèrè mmemme idogharị ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ nsọ na ichenwò ha n'ihu Chineke ọzọ, ya na ịtụ mmamma.

N'okwuchukwu ya n'òfùfè nrò ahụ, Achịbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ 'Most Reverend' Alexander Ibezim kpọkùrù ụmụnwaanyị ka ha gbàá ndụ ịbụ ndị na-ekpere Chineke n'ime mmụọ nà eziokwu, ya na ịbụ ndị ga na-ahụta ma na-ewètakwa ihe ọma n'ebe ọbụla ha hụtàrà onwe ha.

O mèrè ka a mara na Chineke nyèrè  nwaanyị ọbụla bụ onye ezi omume anya nke ime mmụọ iji na-ahụ ihe na-eme n'ezinaụlọ ya, n'ụlọụka, n'obodo ya, nakwa gburugburu ya n'izugbe, ya na akọnuche iji chepụta ụzọ kachasị mma a ga-esi sò ihe ndị ahụ.

Ọ kpọkùzịrị ha ka ha dị ike n'ekpere, na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ya na ọgbụgba ndụ alumdi na nwunye ha, ma na-egosipụtakwa akparamaagwa niile e jiri mara ezi onye nne nà ezi onye otu Christ, iji bụrụ ndị kwụdosiri ike n'okwukwe ma na-etókwa eto n'ime mmụọ na-agbànyèghị ihe iche aka mgba ọbụla nakwa ebilimmiri niile nke ndụ a.

Achbishọọpụ Ibezim, onye okwuchukwu ya gbadoro ụkwụ n'isiokwu na-asị “Chineke Nke Pụrụ Ime Ihe Ekweghị Omume” (God of  Impossibilities” kọwàkwàrà na o nweghị ihe nyịrị Chineke omume, naanị ma ọ bụrụ na ụmụ Ya ga-eweda onwe ha n'ala, chọọ ihu ya ma kpọkuo ya oge niile. O nyèkwàrà ụmụnwaanyị ahụ ndụmọdụ ka ha ñòmie ezi akparamagwa Mary Dị Asọ, bụ onye biri ezi ndụ, ma nwekwa ezi mmekọrịta n'etiti ya na Chineke.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù ụmụnwaanyị na òtù ụmụagbọghọ na mpaghara Niger nà dayọsiis ahụ, ma bụrụkwa nwunye Achbishọọpụ, bụ Oriakụ Chiọma Ibezim kèlèrè Chineke maka etu O siri duru ha wee bàta ahọ ọhụrụ 2022 n'udo, tinyere ọrụ ọma dị icheiche Ọ na-arụ na mpaghara ahụ na dayọsiisi ahụ. 

Ọ kọwàrà ebumnobi ha ji achịkọba mmemme ahụ kwà ahọ, ya na ọtụtụ uru dị icheiche jupụtara na ya; ma mekwazie ka a mara na ha ga-amalite imezupụta na ịbagide n'ọmarịcha atụmatụ dị icheiche ha jiri bata n'ime ahọ ọhụrụ a n'ozuzuokè, ma rịọkwazie ụmụnwaanyị dayọsisi ahụ ka ha sonyesie ike n'ihe ndị ahụ oge a ga-amàlite ha n'uju.

Ọ dụkwàzịrị ụmụnwaanyị ibe ya ka ha bụrụ ezi ndị nne, ma bàgidekwa n'ịgbasàwànyè oziọma nke eziokwu ahụ na Christ na-abịa ọzọ ịkpọrọ ndị nke ya, n'ihi na ụwa abụghị ebe obibi.

N'okwu nke ya, ụkọchukwu na-elekọta òtù ụmụnwaanyị na dayọsiis ahụ, bụ ‘Reverend Canon’   David Ohamara, kèlèrè Chineke maka ọrụ ọma dị icheiche ọ na-arụ na dayọsiisi ahụ, ma kelekwa Bishọọpụ Ibezim na nwunye ya, bụ ndị o ji àkwárá ngwaọrụ pụrụ iche. O kèlèkwazịrị ndị dị icheiche nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ ịhụ na ya bụ oke ụbọchị na ofufe nrò gara siriri wèrèrè, ma kpekwazie ka Chineke nyekwuo ha amamihe, gọzie ma kwụghàchi ha mmaji kwùrù mmaji.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ n'ime ndị a nabàtàrà ọhụrụ n'òtù ụmụnwaanyị dayọsiis ahụ, nke gụnyere Oriakụ Chinenye Onwuteaka, Oriakụ Ndidiamaka Chidiebere na Oriakụ Uzoma Ejiofor kọwàrà ya dịka nnukwu ihe obi añụrị, kelee Chineke maka ohere ọma ahụ, ma kwe nkwà ịga n'ihu na-abụ ndị ezigbo nne ma na-egosipụtakwa akparamagwa ezigbo nne, ma n'ezinụlọ ha dị icheiche, ma n'obodo, nà ebe ọbụla ha hụtara onwe ha.

A nọrọ na ya bụ òfùfè nrò wee kpee usoro ekpere dị icheiche, bụọ abụ olu ụtọ dị icheiche, nyee onyinye ịtụ mmamma pụrụ iche, ma chenwòókwa ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ n'ihu Chieneke, nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa ahà a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484