Ụlọọrụ AIRS Ahazigharịala Ma Chịkọọ Usoro E Si Atụ Ụtụ n'Anambra

Jun 4, 2020 - 00:11
Jan 22, 2021 - 20:31
 0
Ụlọọrụ AIRS Ahazigharịala Ma Chịkọọ Usoro E Si Atụ Ụtụ n'Anambra

Izunna Okafor, Awka

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịtụ ụtụ nà ego a na-enweta n'ime steeti Anambra, bụ ụlọọrụ 'Anambra State Internal Revenue Service (AIRS) ahazigharịala usoro ụlọọrụ na ọdụ ahịa dị iche iche si atụ ụtụ na steeti ahụ, ma wepụtakwa atụmatụ a chịkọtara ọnụ a ga na-agbasozị n'ime nke ahụ.

Atụmatụ ọhụụ ahụ a chịkọtara ọnụ bụ nke e wepụtara na nso nso a, ma bụrụ nke a nọrọ n'isi mbido ọnwa Juunu ahọ a malite idebányesi aha ụlọọrụ na ọdụ ahịa dị iche iche na steeti ahụ isonye na ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Internal Revenue Service (AIRS)' Maazị David Nzekwu kọwara na atụmatụ ahụ chịkọtara ụfọdụ ụtụ ụlọọrụ na ọdụ ahịa dị iche iche na-akwụ na steeti ahụ, mee ka ha dịkọọ ọnụ, ọkachasị dịka o siri metụta ụtụ ndị ahụ a na-akwụnye n'aka ụlọọrụ 'Anambra State Waste Management Agency (ASWAMA)', 'Anambra State Advertising and Signage Agency (ANSAA)' na ndị ọzọ.

O mere ka a mara na ebumnobi usoro ọhụụ ahụ (nke a kpọrọ 'Integrated Billing System' n'asụsụ bekee) bụ iji gbochie nsogbu ịtụ ụtụ ugboro abụọ maọbụ ịnakarị mmadụ ego ole o kwesiri ịkwụ, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ mebie aka ọrụ ndị adịgboloja na-ebugharị onwe ha dịka ndị ọna ụtụ gọọmenti ma na-ezufùsi ego gọọmenti, ọkachasị n'ime oge ọrịa korona a ihe isi ike na-emetụta ewu na ọkụkọ.

O kwuru na e debànyechaa aha ụlọọrụ maọbụ ọdụ ahịa ọbụla, na a ga-enye ya akwụkwọ nwere akara pụrụ iche ọ ga-eji na-akwụnyezị ụtụ nke ya siriri-werere n'akpa gọọmenti, n'enweghị ihe mgbakasị ahụ ọbụa, maọbụ zùte nsogbo na-adịkarị n'ịkwụnye ya n'aka mmadụ, nke ụfọdụ n'ime ya bụ ndị adịgboloja.

Dịka ọ na-akọwa na a ga-eme nke ahụ n'ebe ọbụla e nwere ụlọọrụ na ọdụ ahịa na steeti ahụ, ma n'ime-ime obodo dị iche iche; Maazị Nzekwu kpọkùkwazịrị ụlọọrụ na ọdụ ahịa ọbụla ka ha sonyesie ike na nke ahụ ma gbaa mbọ debanye aha n'akwụkwọ, bụkwa nke a na-edebànye n'efu.

N'okwu ya banyere atụmatụ ọhụụ ahụ, otu onye e debànyèrè aha ya n'akwụkwọ n'usoro atụmatụ ọhụụ ahụ, bụkwa onye nwere ebe a na-asa ụgbọala n'Agụ Awka, Maazị Chukwunweike Ezenwa kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya.
O gosipụtara afọ ojuju ya banyere usoro ọhụụ ahụ, ma kwuo na ọ ga-emezị ka ọ na-akwụnye ụtụ ya n'àkpà gọọmenti site n'ákàrà ahụ pụrụ iche e nyere ya, karịa inyezị mmadụ n'aka dịka ọ dị na mbụ.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme idebanye aha ụlọọrụ dị iche iche n'usoro ọhụụ ahụ ụbọchị ahụ gụnyere onyeisi ngalaba 'Taxpayers Education and Enlightenment Team (TEEN)' bụ ngalaba na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma bànyere ụtụ isi n'ụlọọrụ AIRS, bụ Oriakụ Sylvia Tochukwu-Ngige; onye nlekọta atụmatụ ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra Central, bụ Maazị Sylvester Uzo; ndị ụlọọrụ ASWAMA, ndị ụlọọrụ ANSAA, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.