A Malitena Idebanye Aha Ndị Ntorobịa Anambra Enweghị Ọrụ n'Akwụkwọ

Sep 30, 2017 - 22:51
Jan 22, 2021 - 07:37
 0
A Malitena Idebanye Aha Ndị Ntorobịa Anambra Enweghị Ọrụ n'Akwụkwọ

Izunna Okafor, Awka

A malitena idebanye aha ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti Anambra bụ ndị enweghị ọrụ, n'akwụkwọ. Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ willie Obianọ mere ka a mara nke a n'ofufe nru pụrụ iche a chịkọbara n'ụlọ ụka St. Patrick dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ iji merube mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria.

A malitena idebanye aha ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti Anambra bụ ndị enweghị ọrụ, n'akwụkwọ.

Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ willie Obianọ mere ka a mara nke a n'ofufe nru pụrụ iche a chịkọbara n'ụlọ ụka St. Patrick dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ iji merube mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria.

O sị na a ga-eme ya bụ ndebanye aha dịka ogoogo agụm akwụkwọ onye nwetara si dị, ma sịkwa na ihe e jiri weputa atụmatụ ahụ bụ iji nyere gọọmenti aka ịtụ atụmatụ maka ịkwalite ọdịmma na ezi ọnọdụ obibi ndụ nke ndị ntorobịa na steeti ahụ. O kwuru na ego ya bụ atụmatụ abaana n'amụma ego ọrụ nke ahọ 2018, na a ga-etinyekwa ya n'ọrụ ngwa ngwa ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ nabatara ya bụ amụma ego ọrụ. Gọvanọ Obianọ kọwara na ala anyị Naịjiria nọ na nnukwu ajọ ọnọdụ ugbu a n'ihi ọtụtụ ihe ịma aka chegasịrị ya n'ihu n'oge a, ma kelekwa ndị Anambra n'ihi irube isi ha nye iwu na-achị ala anyị, ọ kachasị n'ihe metụtara ịkpọ ganị ganị na ime ngagharị iwe. Ọ sị na mmemme icheta ọgbụgba ahọ ala Naịjiria nke ahọ a bụ nnọọ oge ntụgharị uche banyere ajọ ọnọdụ niile na-ebi ya bụ mba aka ọjọọ iji weta udo na ezi ọnọdụ tọrọ àtọ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dịọsiisi Ọka bụ 'Most Reverend' Paulinus Ezeokafọr kọwara na ihe kpatara ịkpọ ganị ganị niile na-ewere ọnọdụ n'ala anyị bụ ikpudo eziokwu ihu n'ala, mmegbu, na mpụ na aghụghọ na-aga n'ihu na ya bụ ala, ma kpọkuziekwa onye ọbụla ka anyị na-echeta ala Naịjiria n'ekpere ka Chineke wee nụrụ olu anyị ma gbanweere anyị ọnọdụ. A nọzịkwara n'oge ahụ kpee ọtụtụ ekpere pụrụ iche maka udo na ọganihu nke ala Naịjiria na ùtó nke steeti Anambra.

Ndị ukwu ndị ukwu sonyere n'ofufe nru ahụ gụnyere osote onye isi ala Naịjiria n'oge gara aga bụ Dkt. Alex Ekwueme, otu nwa amadi chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara bụ Ọriakụ Virgie Etiaba, osote aka chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara bụ maazị Emeka Sibeudu na ọtụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmenti.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.