Ndị bi n'Ọnịtsha arịọ enyemaka, dịka iju mmiri tochiri ụfọdụ ụlọ na Fegge

May 29, 2020 - 07:13
Jan 22, 2021 - 20:34
 0

Izunna Okafor, Awka

Ndị bi n'Ọnịtsha akpọkuola ma rịọ gọọmenti steeti Anambra ka ọ gbatara ha ọsọ, dịka iju mmuri wara ma tochibido ụfọdụ ụlọ dị na mpaghara B/H Housing Estate Fegge.

Ajọ ọdachi a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ otu onye ọnọ mgbe o mere ma bụrụkwa onye bi na mpaghara ahụ, bụ Maazị Isidore Uzoatu, bụ onye ziteere Ka Ọ Dị Taa ozi banyere ọnọdụ ahụ.

Dịka Maazị Uzoatu siri kọwaa, iju mmiri ahụ bụ nke na-agba na mgbe na mgbe, ọkachasị n'oge udummiri, n'ihi na e nweghị ebe idè mmiri na-agba na mpaghara ebe ahụ si ehupù. O kwukwara na idè mmiri sì na mgbago na-ehudàta na mpaghara ebe ahụ ma ọ bụrụ na ọwà mmiri dị ebe ahụ ju, wee na-emezị ka ya bụ ọnọdụ kawanye njọ.

Ọ gbarụrụ ihu bànyere ihe ọdachi ahụ, ma kwuo na ọ dị ka a ga-asịzị na gọọmenti na ụlọọrụ ya dị iche iche gbakụtàrà mpaghara ahụ azụ kemgbe ọtụtụ ahọ ole na ole gara aga na-agbanyeghị ụtụ isi ha na-atụ na ego ndị nwere ụlọ na mpaghara ebe ahụ na-akwụ.

Dịka ọ na-ekwu na o teela aka gọọmenti kpàtụrụ aka maọbụ rụọ ọrụ ebe ahụ; Maazị Ụzọatụ gakwazịrị n'ihu kọwaa na ọ bụ ndị bi na mpaghara ahụ jizị aka ha wee na-arụgasị ụfọdụ ọrụ mmetụaka n'ebe ahụ, nke mezịrị ka ihe idè mmiri ahụ mebìrì hara na nso.

Ọ kpọkùzịrị ma rịọ gọọmenti doo ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka iji gbochie ajọ ọdachi ahụ ịga n'ihu na-adapụta n'ihi ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ pụrụ iwètàrà ndị bi na mpaghara ahụ.

N'ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbara ya bànyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ steeti ahụ na-ahụ maka idobe ọwà mmiri ọcha na ichekwaba ọhịa na steeti ahụ, (bụ Anambra State Clear Drainage and Forest Preservation Agency), Maazị Chido Obidiegwu kwuru n'ezie na ha enwetàbeghị mkpesa banyere ọnọdụ ahụ.

Ọ gbara akaebe na nsogbu iju mmiri sò n'otu ihe iche aka mgba na-adapụkarị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ na mgbe na mgbe, ma kwuo na ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ agbaala ma ka na-agbakwa ọtụtụ mbọ dị iche iche pụtara ìhè banyere nke ahụ.

Maazị Obidiegwu gara n'ihu kpọpụtasịa ụfọdụ mbọ dị iche iche ụlọọrụ ya gbagoro na nso nso iji belata nsogbu idè mmiri, nke gụnyere ịkọchasị ọwà mmiri sụchiri asụchi na mpaghara ebe dị iche iche, inye ndị mmadụ nkuzi na ịgbasa ozi banyere mkpa ọ dị idobe ọwa mmiri ha ọcha oge niile, izigara Gọvanọ ozi banyere ebe dị iche iche nsogbu idè mmiri na-enye nsogbu na steeti ahụ (bụ nke a ka na-elebà anya ugbua), tinyere ọtụtụ nzọpụ ụkwụ ndị ọzọ ha zọpụgoro banyere ọnọdụ ahụ.

O chetààrà ọhaneze na ọrụ ka kwụsịlatagodiri n'ụfọdụ ebe dị iche iche e ji ọrụ ngo n'aka n'ime steeti ahụ n'ihi iwu 'onye apụtakwala ezi' ahụ gọọmenti tiri maka ọrịa korona, bụ nke mezịrị ka ụfọdụ ọrụ ka gbaberegodi n'ebe a rụdobere ha oge ahụ.

O kwezịrị nkwa na n'ihi mmaghepù ahụ gọọmenti steeti ahụ malitere ịmaghapù ụfọdụ iwu ndị ahụ e tiri, na ọrụ ga-amalitekwa ịgawanye n'ihu ọzọ n'isingwụcha ọnwa a n'ụfọdụ ebe, ọbụnadị dịka ọ kpọkùkwara ọhaneze ka ha sonyesie ike n'ọrụ mkpocha na nzacha ahụ a ga-eme n'isi ngwụcha ọnwa a. Ọ dụkwara ọdụ ha ka onye ọbụla kwụsị ịwụnye atịtị, ahịhịa na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ n'ọwà mmiri, n'ihi na ọ bụ ihe dị etu ahụ na-enye aka ịsụchisi ọwà mmiri ma mekwa ka idè mmiri na-agba n'ebe ụfọdụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.