Maazị Chineto Ozigbo Achịkọbala Ma Kwàdo Asọmpi Mbem Igbo

Jun 4, 2020 - 00:17
Jan 22, 2021 - 20:26
 0
Maazị Chineto Ozigbo Achịkọbala Ma Kwàdo Asọmpi Mbem Igbo

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụrụ akpọtụ na nso-nso a dịka otu nwaafọ Igbo ọrụ obi ebere na ịkwalite omenala Igbo na-echu ụra, bụ Maazị Chineto Ozigbo chịkọbàrà asọmpi mbem kara maka ndị na-ama mbem n'ala Igbo.

Asọmpi mbem ahụ e mere site n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ, bụ nke weere ọnọdụ n'me ọnwa Mee, ma bụrụkwa nke mmadụ iri ise na anọ sonyere na ya, ebe mpụtara ya bụ nke e wepụtara n'abalị mbụ nke ọnwa Juunu.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye chịkọbara/kwàdoro asọmpi ahụ, ma bụrụkwa onyeisi òtù 'Chineto Ozigbo Foundation', bụ Maazị Valentine Chineto Ozigbo kwùru na ebumnobi o jiri bàgide n'ihe dị etu ahụ bụ iji tute, gosipụta ma chekwaba ịma mma nke ọnatarachi ndị Igbo, ọkachasị dịka o siri metụta ịma mbem.

Ọ kọwara ịma mbem dịka otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo na mgbe gboo, ya otu n'ime ụzọ pụrụ iche e si akọ ụdị akụkọ ntọala dị iche iche, na-eto dike, na-ekwupụta ma na-egosipụtakwa ihe dị iche iche n'ala Igbo; o wee sị na ọmarịcha ihe dị etu ahụ ekwesighị ka a hapụ ya ka ọ nwụọ, ya na ebube niile dị na ya.

O kwupụtakwazịrị obi ànụrị ya nà afọ ojuju ya banyere ọnụọgụgụ ndị ntorobịa sonyere n'asọmpi ahụ, ọkachasị otu obere nwata nwaanyị gbara ahọ iri, bụ Nwada Somtochukwu, onye mekwara nke ọma na asọmpi ahụ.

Ọ sị na, n'ilekwàsị anya na nke ahụ, na ya nwere olileanya na asụsụ na omenala Igbo agaghị anwụ maọbụ fuo, kama na ọ ga-aga n'ihu isi n'aka fère aka ụmụ na-eto eto n'ala Igbo ma e jigidesie ya ike.

Dịka ọ na ekele ndị kpere ikpe asọmpi ahụ, nke gụnyere Ọkammụta Kenneth Kalu, Dọkịta Odyke Nzewi, na Maazị Izu Oraelosi; Maazị Ozigbo, bụkwá onye kwadobụrụ asọmpi egwu ogene n'oge gara aga, kèlèkwazịrị ma dụọ ndị sonyere na asọmpi mbem ahụ (ma ndị tuuru ùgo ma ndị eturughị) ha ka ha jisie ike ma jigidesiekwa ọnatarachi ha ike, iji hụ na asụsụ na omenala Igbo anwụghị.

N'akụkụ nke ụmụnwoke, ndị tuuru ùgo n'asọmpi ahụ bụ Akunne Francis Sopulu (gbara onye nke mbụ, ma nweta ego dị puku naịra iri ise); Desmond Okonkwo (gbara onye nke abụọ, ma nweta ego dị puku naịra iri atọ), na Mbem Ugoezugo Okwodu (gbara onye nke atọ, ma nweta ego dị puku naịra iri abụọ).

N'akụkụ nke ụmụnwaanyị, ndị nwetara mmeri bụ Chinwendu Okafor Nzekwe (gbara onye nke mbụ, ma nweta ego dị puku naịra iri ise); Mbem Nne Akalabo (gbara onye nke abụọ, ma nweta ego dị puku naịra iri atọ), na Mbem Nwada Ngalakwesiri (gbara onye nke atọ, ma nweta ego dị puku naịra iri abụọ).

N'akụkụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, ndị ọzọ gbara malite n'onye nke anọ ruo n'onye nke iri nwètara ego dị puku naịra iri n'otu n'otu, ebe ndị ọzọ niile sonyere na asọmpi ahụ nwetagbadoro puku naịra ise n'otu n'otu, nke mezịrị ka mkpokọta ego e nyere dịka ihe nrita na asọmpi ahụ dịzie narị puku naịra ise na ụma iri abụọ na ise (N525,000).

Ndị dị iche iche nwetara nturugo na imirikiti ndị ọzọ sonyere n'asọmpi ahụ kelere Maazị Ozigbo maka ohere ọma dị etu ahụ, kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji. Ha rịọkwazịrị ya ka o jide ka o ji n'ihe gbasaara inyerịtara ụmụ mmadụ aka na ịkwalite njirimara na omenala Igbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.