Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ A Machiena Otu IPOB

Sep 22, 2017 - 19:30
Jan 23, 2021 - 17:32
 0
Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ A Machiena Otu IPOB

Izunna Okafor, Awka

Otu jikọtara ndị gọvanọ steeti ise nke mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị nọrọ n'izu ụka gara aga wee machie kpamkpam, otu ahụ a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' bụ IPOB n'aha ịchafụ, ma machiekwa ọrụ niile nke bdị otu ahụ. Nke a bụ nke e kwuputara ka ya bụ otu jikọtara ndị gọvanọ mpaghara ahụ mechara nzukọ gbanụ gbanụ maka ọrụ nchekwa, bụ nke weere ọnọdụ naṅobi Gọọmenti Enugu dị n'isi obodo steeti ahụ.

Otu jikọtara ndị gọvanọ steeti ise nke mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị nọrọ n'izu ụka gara aga wee machie kpamkpam, otu ahụ a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' bụ IPOB n'aha ịchafụ, ma machiekwa ọrụ niile nke bdị otu ahụ. Nke a bụ nke e kwuputara ka ya bụ otu jikọtara ndị gọvanọ mpaghara ahụ mechara nzukọ gbanụ gbanụ maka ọrụ nchekwa, bụ nke weere ọnọdụ naṅobi Gọọmenti Enugu dị n'isi obodo steeti ahụ.

Ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu na mmechi nzukọ ahụ, onyeisi otu ahụ jikọtara ndị gọvanọ mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ gọvanọ Dave Umahi mere ka a mara na mkpebi ahụ bụ n'ihi otu ọnọdụ nchekwa siri gbata kwụrụ na mpaghara ahụ nakwa ihe nke ahụ pụrụ iweta. Ọ kpọkuzịkwara ndị otu IPOB na otu ndị ọzọ na-akpọ ganị ganị na malitezie ugbu a gaba, ka ka ha chịkọlọta ma deputa ebumnobi ọbụla ha nwere ma nyefee ya site n'aka ha bụ ndị otu jikọtara ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ahụ, otu Ọhaneze Ndị Igbo na ndị otu ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti sitere na mpaghara ahụ.

Ọ sị na ndị gọvanọ niile nke mpaghara ahụ ga-eleba anya ịhụ na e mere nke ahụ otu e siri kpebie ya na steeti ha dị iche iche.

O kwupụtanworo nkwado nke otu jikọtara ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ahụ, nke Ọhaneze Ndị Igbo na nke ndị otu ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti sitere na mpaghara ahụ nyegara ịdị n'otu nke ala Naịjiria, ọbụnadị dịka ha na-akpọ oku maka ihazigharị ala Naịjiria iji hụ na e nwere ikpe nkwụmọtọ na ime ihe otu o siri kwesi ekwesi nyegara ụmụafọ Naịjiria na-enweghị onye ọbụla a na-akpagide.

Ndị otu kwukwara hoohaa na ntụli aka ahụ a ga-eme na steeti Anambra n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ga-ewererịrị.ọnọdụ, ma gwaziekwa onyeisi ala bụ Muhammad Buharị ka o were ọsọ were ije kposie ndị ọrụ agha niile ahụ o zidatara na mpaghara ahụ, maka na e sighị n'ọdụ agbọ akwụ.

Ha kwuru na ha bụ ndị gọvanọ azọpụgo ụkwụ dike dị iche iche iji hụ na e nwere ezi nchekwa ndụ na akụkụba n'akụkụ ọbụla nke mpaghara ahụ niile, tinyere nchekwa nke ụmụafọ Igbo bigasị na mgbago ugwu ala anyị. Ha kwuzịkwara na ha na-emezị nnyocha dị omimi banyere mgbusi ahụ e gbusiri mmadụ na arụrụ ala dị iche iche a rụgoro na mpaghara ahụ nso nso a, ma kpọkukwa ụmụafọ mpaghara ahụ ka ha bụrụ ndị na-erubere iwu ala anyị isi.

Ndị gọvanọ niile nke steeti ise dị na mpaghara ahụ bịara ya bụ nzukọ, beelụ sọ nke steeti Imo, bụ onye zitere osote ya maazị Eze Madumere.

Ndị ọzọ ezitere na ya bụ nzukọ gụnyere osote onyeisi ụlọ ọgbakọ sineet bụ maazị Ike Ekweremadụ bụ onye nọchitere anya ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti na ya bụ nzukọ, onye kọmanda nke '82 Division' nke ndị ọrụ agha ala Naịjiria bụ 'Major General' Adamu Abubakar, onyeisi izugbe nke Ọhaneze Ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu bụ maazị Nnia Nwodo nakwa ndị isi ndu nke otu IPOB.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.