Ụlọelu Òkpùkpù Atọ Adaala, Tigbuo Ọtụtụ Mmadụ

May 6, 2022 - 12:02
May 6, 2022 - 12:50
 0
Ụlọelu Òkpùkpù Atọ Adaala, Tigbuo Ọtụtụ Mmadụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

 Opekatampe mmadụ iri anwụọla ka ụlọelu okpukpu atọ dara na Lagos. Ya bụ ọdachi dapụtara na ‘24 Ibadan Street Site, Murtala Mohammed Way’ dị na mpaghara Ebute Metta, steeti Lagos.

Ya bụ ihe mere ka o jiri ọkara gafee elekere iri nke abalị n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee, nke mezịrị ka ndị na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadụ na steeti ahụ gbasie mbọ ike ịzọpụ̀tà ndụ ndị mmadụ. Ọnụọgụgụ ndị a zọpụtara ma bụrụ ndị gụnyere ụmụaka, ruru iri abụọ na anọ. Ọtụtụ n'ime ha ka e kwuru na ha nwetàra mmerụ ahụ n'ụdị dị icheiche.

Ndị bi n'ụlọ ahụ nọ n'ime ya ebe ọtụtụ n'ime ha lakpurula ụra abalị mgbe ụlọ ahụ jiri daa na mberede, nke mere ka ọtụtụ tọkị̀rị́ n'ime ya. 

Ozigbo ahụ, a kpọtụụrụ ndị ọ dị n'aka, nke mere ka ha gbakàrịba ala n'egbughị oge ọbụla, ebe ụfọdụ ndị bi n'ogbe ahụ wepụtara onwe ha site n'ịwagharị n'ikpo ụlọ ahụ dara ada, na-azọpụta ndị tọkịịrị n'ime ya tupu ndị ọrụ gbanụ̀gbanụ̀ bịa, wee malite ọrụ.

Ndị ọrụ ihe ndapụta ahụ gụnyere ‘National Emergency Management Agency (NEMA)‘, ‘Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA)’, ‘Lagos State Fire Service’, ‘Red Cross Society of Nigeria’, na ndị òtù ọrụ ịzọ ndụ ndị ọzọ, tinyere ndị uweojii gbatara ọsọ ebe ahụ ma rụọ ọrụ ọma.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye jigodịli ọkwa dịka onye nhazi (acting Coordinator), Lagos Territorial Office n', ụlọọọrụ NEMA, bụ Maazị Ibrahim Farinloye, kwuputara na mmadụ iri nwụrụ n'ezie ma rụtụkwa aka na ọ teela aka e jiri kpebie ma kwuo na a ga-akwatu ụlọ ahụ dara ada, nke mezịrị ka e nye ya akara nkwatù.

Ọ gara n'ihu kwuo na a kara ụlọ ahụ akara iji gosi na o nwere nsogbu, ma gwakwa ndị bi ebe ahụ ka ha kwapụ̀, mana ndi ahụ bi na ya achọghị ịma ma ya fọ̀dụzie ịña ntị na ntụziaka nkwapụ̀ e nyere ha . 


Kaosiladị, o kwukwara na ndị ọrụ ‘Lagos State Building Control Agency’ akpọchiela ụlọ ahụ ugbua ihe a mèchàrà, ma chụpụ ndị niile bi na ya.

O mere ka a mara na ndị ahụ nwụrụ anwụ dị ụmụnwoke isii na ụmụnwaanyị anọ nke gụnyere otu onye na-efe ala anyị n'okpuru atụmatụ ‘National Youth Service Corps (NYSC)’. Ndị a zọpụtarala na ndụ dị ụmụaka asaa na ndị okenye iri na asaa.

Na ntụnye nke ya, Odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ LASEMA, Maazị Olufemi Oke-Osanyintolu, site n'ozi ya, kwùrù na e bugara ụfọdụ ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ ‘Lagos State University Teaching Hospital (LASUTH)’.

N'akụkụ nke ya, nwa onye nwe ụlọ ahụ bụ onye nke na-elekọta ya ma bụrụkwa onye bibu n'ụlọ ahụ kwùrù na o nyela ndị bi n'ụlọ ahụ ozi ka ha kwapụ ma ha jụrụ ajụ. O kwuru na ya si n'ụlọ ahụ kwapụ ebe ndị bi na ya kwụsịkwara ịkwụ onye ọbụla ụgwọ.

Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Muhammadu Buhari akọwaala ọdịda ụlọ na-adakarị n'ala anyị dịka ihe adịghị mma ma kpọọ oku ka ndị ọ dị n'aka hie asaa n'anya iji hụ na ọ kwụsịrị ngwangwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484