N'Anambra, Ụlọọrụ FRSC Emeela Ncheta Ụbọchị Ndị Nwere Ihe Mberede Okporoụzọ

Nov 26, 2021 - 22:40
 0
N'Anambra, Ụlọọrụ FRSC Emeela Ncheta Ụbọchị Ndị Nwere Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Imirikiti ụmụafọ steeti sonyeere ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ n'ime steeti Anambra, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' wee merùbe mmemme ichètà ndị nwere na ndị nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ nà ikpere ha na mkpụrụobi ha ekpere.

Mmemme ahụ bụ nke onyeisi ụlọọrụ FRSC n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi duru ọhaneze na ndị ụlọọrụ ya wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke e jiri ofufenrò wee mee, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Patrick's Cathedral' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ ụka Katọliiki na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor kọwara ụbọchị ahụ dịka nke kwesiri ka e lebàra ya anya nke ọma n'ihi oke mkpà ọ dị ibelata oke ihe mberede okporoụzọ na-adapụtazị aghara aghara n'oge ugbua ma bụrụkwazie nke na-ata isi ụmụ mmadụ kwà ụbọchị ọbụla.

O kwezịrị ụlọọrụ FRSC na ọtụtụ ndị sonyere na mmemme ahụ nkwà na ụlọụka ahụ na dayọsiisi ahụ ga-aga n'ihu inye ha nkwàdo kwesiri ekwesi n'agha ha na-ebu megide ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị site n'inyere ha aka n'ịgbasà ozi banyere nke ahụ, iji belata ya bụ ajọ ọdachi. O kwekwàrà nkwa na ha ga na-ekpere ndị nwere ihe mberede okporoụzọ na ndị na-agba n'okporoụzọ ekpere oge niile.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Onyeisi ụlọọrụ FRSC n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi, onye kwuru okwu site n'ọnụ osote ya, bụ Chika Akachukwu kọwara na mmemme na ụbọchị ncheta ahụ bụ nke e ji atụgharị uche n'óké uru ndụ mmadụ bara na mkpa ọ dị ịkpachapụrụ ya anya mgbe a na-agba n'okporoụzọ. Ọ dụkwàzịrị ndị na-agba n'okporoụzọ ọdụ ka ha na-akpachapụ anya, na-adị uchu, na-enwe ndidi, ma na-erubekwara iwu na-achị okporoụzọ isi oge ọbụla, maka na ọ bụ inupuru iwu na-achị okporoụzọ isi kacha ewèta ihe mberede okporoụzọ.

Dịka ọ na-akọwa na ụbọchị ahụ dịkwà oke mkpà iji kwàdó ndị nwere ihe mberede okporoụzọ, ọ kpọkwazịrị oku ka e belata ịgba oke ọsọ n'okporoụzọ, ma na-ekpekwara ndị na-agba n'okporoụzọ na ndị nọ n'ụzọ ije ekpere oge niile. O kelere gọọmenti steeti Anambra maka ezi nkwàdo ọ na-enye ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya.

Na ntụnye nke ya, onye nhazi ngalaba 'Special Marshal' n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Ismile Patrick kọwara na ụlọọrụ FRSC na ndị ọrụ ya anaghị anọ n'ụzọ maka iji megide onye ọbụla maọbụ iji naa ego ekwesighị ekwesi, kama na ọ bụ iji hụ na e nwere ije awele na ezi nchekwa ndụ n'okporoụzọ, ọbụladị dịka ọ rịọzịrị ndị na-agba n'okporoụzọ ka ha na-asọpụrụ ndị ọrụ FRSC na iwu okporoụzọ.

A nọrọ ụbọchị ahụ wee kpee usoro ekpere dị icheiche, ma n'ụlọụka ma n'ụlọ alakụba, ma gakwa njem nleta n'ụlọọgwụ dị icheiche iji leta ndị nwere ihe mberede okporoụzọ nọgasị n'ebe ahụ anara ọgwụgwọ.

Ọ dị ncheta na òtù mba ụwa 'United Nations' nọrọ n'ahọ 2005 wee kwuwaa na ụbọchị ụka nke atọ n'ime ọnwa Nọvemba ahọ ọbụla ga na-abụ ụbọchị icheta ndị nwere n'ihe mberede okporoụzọ na mba ụwa gbaa gburugburu. A na-ejikwazị ụbọchị ahụ wee na-enye nkụzi ma na-agbasa ozi banyere ihe mberede okporoụzọ na ihe mgbu dị icheiche ọ na-ewètara onye, ezinụlọ maọbụ obodo ọbụla o metụtara; ma nyekwazie ndụmọdụ banyere etu a ga-esi belata ya.
 
Ya bụ mmemme bụkwazị nke a na-ana anọ na ya wee na-eruru ndị dị icheiche nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ uju; na-enwe ịgba nkịtị otu nkeji iji kwanyere ha ùgwù; ma na-ekpekwa ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484