Ndị Nna 'Chapel of Redemption' Emeela Ụka Nna 2021 n'Ụdị Pụrụ Iche

Ndị Nna 'Chapel of Redemption' Emeela Ụka Nna 2021 n'Ụdị Pụrụ Iche

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Dịka ndị nna ụlọụka 'Chapel of Redemption' nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, sònyèèrè ndị otu ha na mba ụwa wee merùbe mmemme ụbọchị ụka ndị nna nke ahọ 2021; a kpọkuola ma dụọ ndị nna ọdụ ka ha na-azụlite ụmụ ha n'ụzọ Chineke, dịka ndịisi ọzụzụ atụrụ ezinụlọ ha dị iche iche.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ Achbishọọpụ mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ Achbishọọpụ Alexander Ibezim, n'ozi pụrụ iche ọ kụpụụrụ ndị nna na mmemme ụka nna nke ahọ a.

N'ozi ahụ, nke ụkọchukwu Venerebụlụ Obiorah Alokwu gụpụtara na mmemme ụka nna ahụ n'ụlọụka 'Chapel of Redemption, nke 'Unizik Temp. Site'; Achbisọọpụ Ibezim kèlèrè ndị nna maka óké ụbọchị ahụ pụrụ iche, ma gwa ha ka ha gbalịsịa ike ñòmie Joseph nke akwụkwọnsọ, bụ onye ọzụzụ o nyere Kraịst gbàdòrò ụkwụ n'ịzụlite ya n'ọkpụrụkpụ ngalaba anọ, dịka ọ dị n'akwụkwọ Luk 2:41,42 na 52; ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ wepụta usoro nlereanya ndị nna taa kwesiri ịdị na-agbaso wee na-azụlite ụmụ ha.

Achbishọọpụ Ibezim mèrè ka a mara na ihe anọ ahụ Kraịstị toro na ya gụnyèrè amamihe, òtútó nke ahụ, inwe ihuọma n'ebe Chineke nọ, na inwe ihuọma n'ebe mmadụ nọ; ọbụladị dịka nyezịrị ndị nna ndụmọdụ ka ha kụziere ụmụ ha inwe ezi mmekọrịta nke onwe ha na Chineke, gwa ha ka ha na-ahụ ndị nwunye ha n'anya, ma gwakwazie ha ka ha jikọta ezinụlọ ha ọnụ, dịka Joseph mere, n'ụzọ ọ ga-enye Chineke òtùtó.

Ya bụ nnukwu onye ndu ụka Angịlịkan dọkwàzịrị ndị nna aka na ntị ma gwa ha na ọnọdụ nwekwàrà ike ịkawanye njọ n'ọdịnihu karịa ka ọ dị ugbua, ma ọ bụrụ na ha etuteghị ma gbasobe usoro ịzụlite nwata n'ụzọ kwesiri ekwesi nà n'égwù Chineke.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na mmemme ahụ, onyeisi òtù ndị nna n'ụlọụka 'Chapel of Redemption' ahụ, bụ Sa Dọkịta Chike Nwankwọ kọwàrà ụbọchị ahụ dịka óké ụbọchị pụrụ iche e wepụtara maka imerùbè ndị nna, ma kelee onye ọbụla bịara nọnyere mà kwàdo ha, n'agbànyèghị etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri debe imi na ọnụ ugbua, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke kwụghàchi ha mmaji kwuru mmaji. O kwupụtazịkwàrà olileanya o nwere na ọnọdụ akụnụba ala Nigeria ga-adị mma oge adịghị anya.
 
N'okwu nke ya, onyeisioche òtù ọrụ hụrụ maka ịhazi ụbọchị ụka nna nke ahọ a, bụ Maazị Uche Uwaezuoke kèlèkwàrà ndị tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ ụbọchị gara nke ọma, ma kwupụtazie olileanya ya na mmemme ụka nna nke ahọ na-abịa abịa ga-amakarị nke ahọ a.

Ihe dị iche iche mere ka ya bụ mmemme dàá ụdà gụnyèrè ejìjé ndị nna mere, abụ olu ọma ha bụrụ, inye ndị nne ihe onyìnyé e jiri meere ha ụka nna, tinyéré inye onyinye nkwanyeùgwù nyegara ụfọdụ ndị nna, bụ ndị a sara anya na mmiri wee họpụta maka ya bụ nkwanyeùgwù, dịka ihe ha mepụtara n'òtù ndị nna nà ntụnye ha n'ụlọụka siri dị.

Ndị ahụ e nyere onyinye nkwanyeùgwù ahụ gụnyèrè: Ọkammụta Benjamin O. Njelita, Flt. Lt. John I.C. Meludu, Sà Kenneth N. Ejeckam, na Chiifu Alexander N.C. Onubiyi, bụ ndị ihe e dere ede banyere ha gosìrì n'ezie na ha tozùrù òkè inwete ya bụ nkwanyeùgwù 'Veteran of Fathers' Fellowship'.

N'ụzọ nyere aha Chineke òtùtó, a nọkwara na ya bụ mmemme wee rie ma ñụọ, maka na ọ na-abụ a nọkọọ, e righị, ọ dị ka e jere ibesu ozu n'ọha mmụọ.