Ụgbọala Bu Mmanụ Ọkụ Atọla n'Ebe Ụzọ Kewàrà Abụọ n'Anambra

Sep 22, 2021 - 20:01
 0
Ụgbọala Bu Mmanụ Ọkụ Atọla n'Ebe Ụzọ Kewàrà Abụọ n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a


Okporoụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha wee gaa Owerri nọrọ ụbọchị Mọnde wee kebie abụọ, n'ihi mbize na-eme mkpamkpa na mpaghara ahụ, ya na n'ihi oke mmiri ozuzo ahụ zoro na nsonso a.

Ka ọ gachara áwà olenaole nke ahụ jiri mee, otu nnukwu ụgbọala e ji ebu mmanụọkụ danyere ma tọkịrị n'ime ebe ahụ ụzọ kèwàrà abụọ, ụfọdụ mmanụọkụ o bu wee wụfuo.

Dịka akụkọ siri kọọ, ụgbọala ahụ bu mmanụọkụ na-ewèchara ọsọ n'okporoụzọ ahụ, wee ruo mgbe ọ danyere ma tọkịrị n'ime ebe ahụ mbize kewara abụọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' (FRSC) n'ime steeti ahụ, bụ CC Adeoye Irelewuyi kwuru na ụgbọala ahụ si otu ebe buru mmanụọkụ ahụ wee na-aga agbapụ ya tupu nke ahụ wee mee,. Ọ kọwakwara na ha egbochiela akụkụ ụzọ ahụ mebiri emebi iji kwụsị ndị mmadụ ịgba na ya, maka ọnwụ.

O nyere ndị mmadụ, ọkachasị ndị na-anyà ụgbọala ndụmọdụ ka ha kwụsịzie ịgba ụzọ ahụ ma gbabazie ụzọ ndị ọzọ, ọbụladị dịka o nyere owuweanya na ndị ọrụ ya nọ ọrụ ma kwụrụkwa chịm iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'ihi nke ahụ
O kwukwàzịrị na a kpọọla ụlọọrụ gọọmenti etiti na-ahụ maka ọrụ, zie ha ozi maka nke ahụ, ma kwuo na e zipụla ụlọọrụ ngo ga-abịa idozigharị ya bụ okporoụzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484